Psoriasis: Gịnị bụ ọrịa akpụkpọahụ a na ihe na-ebute ya?

Nwada Kosisochukwu nwere ọrịa Psoriasis, n'ele kamera anya. Akpụkpọahụ ya gosiri ntukasi ihe, nke gosiri na o nwere ọria Psoriasis.
Nkọwa foto, Kosisochukwu Okafor bụ Nwagbọghọbịa nwere ọrịa akpụkpọahụ Psoriasis.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọrịa 'Psoriasis' bụ ọrịa akpụkpọahụ nke ihe e jiri mara ya bụ itukasị mmadụ ihe n'ahụ, etuto ito n'ahụ na ahụ mmadụ ịkpekasị ekpekasị.

Ọrịa ahụ na-eme ka anụahụ mmadụ jọọ njọ, na-akọ onye ahụ ọkọ nke ukwuu, mana ọ naghikwa efe efe.

Psoriasis amaghị nwata nke o ji ama okenye, ọ bụghị ọrịa mbute kama ọ bụ ọrịa nọ n'ime ahụ nke ihe na-akpata ya bụ ihe bekee kpọrọ "immune system" ndị ọ na-arịa esighị ike ma zue oke etu o kwesịrị.

Dịka nwada Kosisochukwu bụ nwata nwaanyị nwere ọrịa Psoriasis. I lee ya anya n'ahụ, Ị ga-ahụ etuto, apa apa na-agba mmiri n'ahụ ya nakwa ahụ mkpekasị.

Kosisochukwu gwara BBC na ya dị afọ iri na isii oge a chọpụtara na ihe ahụ na etokasị ya n'ahụ bụ ọrịa ahụ akpọrọ 'Psoriasis'.

Dịka o siri kwuo "Akụkụ ahụ m dịka ikpere ụkwụ m na nku aka m, ya bụ ebe ndị Oyibo na-akpọ 'joints'. Ha na-egbu m mgbu n'ahụ m niile. Ọ bụrụ na ọ zaa, ọ na-enwe otito ndị na-enwe mmiri n'ime ya. O meekwa, ọ gbawaa."

Kosisochukwu kwuru na mbụ, na ya chere na ọ bụ obere ihe ga-abụ o mechaa ọ laa, mana ọ maghị na ya bụ ọrịa enwebeghị ọgwụgwọ ugbua. Naanị ihe ndị dọkinta na-enye ya bụ ọgwụ, sị ya ṅụọ ya ma zuwa ike.

Iji zaa ajụjụ ihe ndị ọnọdụ akpụkpọ anụahụ ya n'egbochi ya ime, o kwuru;

"O nweghị ihe m ga-asị na o gbochiri m karịakwa na m amalitebeghị ịga akwụkwọ, mana ọ bụrụ maka akwụkwọ, aga m aga akwụkwọ."

Kosisochukwu jikwa page ya na soshal midia wee na-etinye onyonyo onwe ya iji kasie ndị ọzọ na-agabiga nnukwu ihe dika nke ya obi ka ha ghara inwe obi nkolopu.

"Mgbe ọbụla m lere onwe m anya n'enyo, ihe m na-ahụ bụ nwatakịrị siri ike, nwatakịrị bịara ụwa ime nnukwu ihe. Otu ihe m ga-asị na ọ bụ ihe m chọrọ ka o (Chukwu) meere m bụ ka ahụ dị m mma ọzọ. Ka m dịkwa mma, ọ bụ otu ihe m chọrọ".

Kedụ njirimara ọrịa Psoriasis?

Ọ bụ ọtụtụ mgbaama ka e ji ama ọrịa Psoriasis bụ nke gụnyere:

Ahụ mmadụ ikpekasị, na-akọ onye ahụ ọkọ ma na-enwu ha ọkụ n'ahụ.

Anụahụ mmadụ ịkpọ nkụ ma nwekwa ike ịgba ọbara.

Akpụkpọahụ ịchagharị ma chawa oji oji, edo edo ma ọ bụ ọbara ọbara.

Mbọ ụkwụ na mbọ aka mmadụ ịgbaji agbaji.

"O nwere ihe ndị Oyibo na-akpọ 'flare up'. M nwee ya n'ahụ m, ọ ga na-eme ka ahụ na-akọ m ọkọ," ka Kosisochukwu Okafor gwara BBC.

Aka mmadụ Psoriasis n'eme
Nkọwa foto, Aka mmadụ Psoriasis n'eme

Kedụ ụdịrị ọria 'Psoriasis' dị iche iche e nwere n'ụwa?

Dịka ụlọọgwụ Cleveland Clinic siri depụta ya, ọrịa ahụ dị n'ụdị n'ụdị bụ nke gụnyere:

Plaque Psoriasis: ọ bụ nke kacha dị bara bara, ka o si eme bụ ihe yiri akpụkpa na mkpekasi dị n'ikpere ụkwụ, ikpere aka nakwa n'ala isi mmafụ niile.

Guttate Psoriasis; nke a bụ kiri kiri ihe dị kpọm kpọm na-etokasị n'ahụ mmadụ. Nje 'bactaria' ahụ nwekwara ike ime mmadụ ọrịa akpịrị.

Inverse Psoriasis; ọ bụ etuto gbara okpụrụkpụ, ọbara dị n'ime ya. Ebe nke a n'anọkarị bụ na nkpa-abụ ma ọ bụ n'ime apata ụkwụ.

Pustular Psoriasis; nke a bụọnya abụ dị n'ime ya ma gburu gburu ya na-acha ọbara ọbara.

Erythrodermic Psoriasis; Nke a adịghị bara bara. Ọ na-eme n'ahụ niile. Nke a na-eji etuto, ahụ mkpekasị, ahụ ịkọ ọkọ ma ahụ ịcha ọkụ wee kpuchie ahụ onye ahụ niile.

Ụdịrị ọrịa Psoroasis na-arịa mmadụ ga-eme ka ndị dọkinta mara ụdị nrị a ga-asi ha na-eri, ụdị ude ha ga na-ete nakwa ncha ha ga-eji saa ahụ.

Kedụ etu e si agwọ ọrịa 'Psoriasis'?

Ọria Psoriasis enweghị ọgwụgwọ kpam kpam, kama e nwere ọgwụ, ude na ihe ndị ọzọ nwere ike ibelata ya nke ukwu.

Ọtụtụ ndị dọkinta na-eji nke a kpọrọ 'UV light', ọgwụ na-eme ka "overactive Immune" jụọ oyi .

Onye ọbụla nwere ọrịa Psoriasis kwesiri ịgbara ihe ndị nwere ike ikpolite ya, (trigger) ọsọ ka ọ ghara inwe nke bekee kpọrọ (flare up).