Psoriasis: Gịnị bụ ọrịa akpụkpọahụ a na ihe na-ebute ya?

Ọrịa 'Psoriasis' bụ ọrịa akpụkpọahụ nke ihe e jiri mara ya bụ itukasị mmadụ ihe n'ahụ, etuto ito n'ahụ na ahụ mmadụ ịkpekasị ekpekasị.
Ọrịa ahụ na-eme ka anụahụ mmadụ jọọ njọ, na-akọ onye ahụ ọkọ nke ukwuu, mana ọ naghikwa efe efe.
Psoriasis amaghị nwata nke o ji ama okenye, ọ bụghị ọrịa mbute kama ọ bụ ọrịa nọ n'ime ahụ nke ihe na-akpata ya bụ ihe bekee kpọrọ "immune system" ndị ọ na-arịa esighị ike ma zue oke etu o kwesịrị.
Dịka nwada Kosisochukwu bụ nwata nwaanyị nwere ọrịa Psoriasis. I lee ya anya n'ahụ, Ị ga-ahụ etuto, apa apa na-agba mmiri n'ahụ ya nakwa ahụ mkpekasị.
Kosisochukwu gwara BBC na ya dị afọ iri na isii oge a chọpụtara na ihe ahụ na etokasị ya n'ahụ bụ ọrịa ahụ akpọrọ 'Psoriasis'.
Dịka o siri kwuo "Akụkụ ahụ m dịka ikpere ụkwụ m na nku aka m, ya bụ ebe ndị Oyibo na-akpọ 'joints'. Ha na-egbu m mgbu n'ahụ m niile. Ọ bụrụ na ọ zaa, ọ na-enwe otito ndị na-enwe mmiri n'ime ya. O meekwa, ọ gbawaa."
Kosisochukwu kwuru na mbụ, na ya chere na ọ bụ obere ihe ga-abụ o mechaa ọ laa, mana ọ maghị na ya bụ ọrịa enwebeghị ọgwụgwọ ugbua. Naanị ihe ndị dọkinta na-enye ya bụ ọgwụ, sị ya ṅụọ ya ma zuwa ike.
Iji zaa ajụjụ ihe ndị ọnọdụ akpụkpọ anụahụ ya n'egbochi ya ime, o kwuru;
"O nweghị ihe m ga-asị na o gbochiri m karịakwa na m amalitebeghị ịga akwụkwọ, mana ọ bụrụ maka akwụkwọ, aga m aga akwụkwọ."
Kosisochukwu jikwa page ya na soshal midia wee na-etinye onyonyo onwe ya iji kasie ndị ọzọ na-agabiga nnukwu ihe dika nke ya obi ka ha ghara inwe obi nkolopu.
"Mgbe ọbụla m lere onwe m anya n'enyo, ihe m na-ahụ bụ nwatakịrị siri ike, nwatakịrị bịara ụwa ime nnukwu ihe. Otu ihe m ga-asị na ọ bụ ihe m chọrọ ka o (Chukwu) meere m bụ ka ahụ dị m mma ọzọ. Ka m dịkwa mma, ọ bụ otu ihe m chọrọ".
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ njirimara ọrịa Psoriasis?
Ọ bụ ọtụtụ mgbaama ka e ji ama ọrịa Psoriasis bụ nke gụnyere:
Ahụ mmadụ ikpekasị, na-akọ onye ahụ ọkọ ma na-enwu ha ọkụ n'ahụ.
Anụahụ mmadụ ịkpọ nkụ ma nwekwa ike ịgba ọbara.
Akpụkpọahụ ịchagharị ma chawa oji oji, edo edo ma ọ bụ ọbara ọbara.
Mbọ ụkwụ na mbọ aka mmadụ ịgbaji agbaji.
"O nwere ihe ndị Oyibo na-akpọ 'flare up'. M nwee ya n'ahụ m, ọ ga na-eme ka ahụ na-akọ m ọkọ," ka Kosisochukwu Okafor gwara BBC.

Kedụ ụdịrị ọria 'Psoriasis' dị iche iche e nwere n'ụwa?
Dịka ụlọọgwụ Cleveland Clinic siri depụta ya, ọrịa ahụ dị n'ụdị n'ụdị bụ nke gụnyere:
Plaque Psoriasis: ọ bụ nke kacha dị bara bara, ka o si eme bụ ihe yiri akpụkpa na mkpekasi dị n'ikpere ụkwụ, ikpere aka nakwa n'ala isi mmafụ niile.
Guttate Psoriasis; nke a bụ kiri kiri ihe dị kpọm kpọm na-etokasị n'ahụ mmadụ. Nje 'bactaria' ahụ nwekwara ike ime mmadụ ọrịa akpịrị.
Inverse Psoriasis; ọ bụ etuto gbara okpụrụkpụ, ọbara dị n'ime ya. Ebe nke a n'anọkarị bụ na nkpa-abụ ma ọ bụ n'ime apata ụkwụ.
Pustular Psoriasis; nke a bụọnya abụ dị n'ime ya ma gburu gburu ya na-acha ọbara ọbara.
Erythrodermic Psoriasis; Nke a adịghị bara bara. Ọ na-eme n'ahụ niile. Nke a na-eji etuto, ahụ mkpekasị, ahụ ịkọ ọkọ ma ahụ ịcha ọkụ wee kpuchie ahụ onye ahụ niile.
Ụdịrị ọrịa Psoroasis na-arịa mmadụ ga-eme ka ndị dọkinta mara ụdị nrị a ga-asi ha na-eri, ụdị ude ha ga na-ete nakwa ncha ha ga-eji saa ahụ.
Kedụ etu e si agwọ ọrịa 'Psoriasis'?
Ọria Psoriasis enweghị ọgwụgwọ kpam kpam, kama e nwere ọgwụ, ude na ihe ndị ọzọ nwere ike ibelata ya nke ukwu.
Ọtụtụ ndị dọkinta na-eji nke a kpọrọ 'UV light', ọgwụ na-eme ka "overactive Immune" jụọ oyi .
Onye ọbụla nwere ọrịa Psoriasis kwesiri ịgbara ihe ndị nwere ike ikpolite ya, (trigger) ọsọ ka ọ ghara inwe nke bekee kpọrọ (flare up).






























