Psoriasis: 'Ọ ga-adị m mma ma akpụkpọahụ m dịkwa larịị ka nke ndị ọzọ'

Aha onyonyo, Psoriasis: 'Ọ ga-adị m mma ma akpụkpọ ahụ m dịkwa larịị ka nke ndị ọzọ'
Psoriasis: 'Ọ ga-adị m mma ma akpụkpọahụ m dịkwa larịị ka nke ndị ọzọ'
Mgbe e biputara ya

Kosisochukwu Okafor bụ nwagbọghọ dị afọ 20 nwere ọrịa akpụkpọahụ a maara dịka Psoriasis.

Psoriasis bụ ọrịa na-eme ka akpụkpọahụ mmadụ zaa azaa. Njirimara Psoriasis gụnyere akpụkpọahụ zara aza, nke agwa ya dị iche ma nweekwa akpịrịkpa.

Ọ na-akọ ọkọ, na-egbu mgbu ma na-ebutekwa ahụ mgbakasị.

Psoriasis abụghị ọrịa na-efe efe, i nweghị ike ibute Psoriasis ma gị na onye nwere ya nwee mmetụta ahụ.

Ka ọ dị ugbua, enwebeghị ọgwụgwọ maka Psoriasis, mana e nwere ụzọ dị iche iche e si elekọta ya.