A tọhapụla Simon Ekpa n'ụlọmkpọrọ mba Finland mana ikpe ya ebibeghi kpamkpam

Simon gbara akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị ka e belata afọ ole a tụrụ ya mkpọrọ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

A tọhapụla Simon Ekpa bụ onyeisi otu n'ime ndị chọrọ mnwereonwe Biafra a kpọrọ United States of Biafra site n'ụlọmkpọrọ mba Finland.

Otu ụlọọrụ ntaakụkọ na mba Finland bụ yle kwupụtara nke a n'akụkọ dị n'obaozi ha n'ụbọchị 17 Nọvemba 2026.

Ozi kwuru sị na "A tọhapụla Simon Ekpa taa. Ekpa gara nọ n'ụlọikpe kamgbe ka e nweeike ileba anya n'ọnọdụ mkpọrọ a tụrụ ya."

Nke a na-abịa dịka ụlọikpe mkpegharị na mba Finland budatara afọ ole a tụrụ Ekpa mkpọrọ site n'afọ isii gbadata n'afọ anọ.

Simon Ekpa bụ onye a tụbuuru nga afọ isii maka ebubo ịkpalite iyi ndụ egwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Nigeria

Mana osote ọkaiwu ukwu gọọmenti mba Finland ga-ewepụ ikpe ahụ n'ụlọikpe kachasị bụ 'supreme court' ka e leba anya na ntaramahụhụ e nyere ya.

Ha chọrọ ka ụlọikpe nye Ekpa ntaramahụhụ sikwuru ike ma kpebie etu Ụlọikpe Kachasị ga-esi na-ahụta okwu banyere iyi ndụ egwu.

Akụkọ kwuru na Tommi Heinonen bụ onye enyemaka Ekpa n'ụlọikpe mkpegharị kwuru na Ekpa n'onwe ya chọkwara ibuga okwu ahụ n'Ụlọikpe Kachasị. Ọ sị na ọ gwabeghi Ekpa okwu kamgbe a tọhapụrụ ya.

Akụkọ malitere ifegharị na soshal midia ugbua banyere ntọhapụ Simon Ekpa site n'ụlọ mkpọrọ.

Ihe otu n'ime ndị ọkaiwu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Aloy Ejimakor kwupụtara na soshal midia X ma sị na a tọhapụla Simon Ekpa site n'ụlọmkpọrọ mba Finland.

Aloy sị na ndị otu Simon Ekpa mere ka ọ mata nke a site na mkparịtaụka ha nwere n'ekwentị

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

N'otu aka ahụ, Ngozi Orabueze sị na ọ bụ osote Simon Ekpa n'otu ha kwuru na "ndị otu United State of Biafra Citizens, anyị nọ ebe a ịnabata onyeisi anyị Simon Ekpa Njoku dịka o si n'ụlọ mkpọrọ mba Finland pụta."

O dere nke n'akara X ya n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde 17 Nọvemba 2026.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Cheta na ụlọikpe dị na mba Finland tụrụ Simon Ekpe mkpọrọ afọ isii n'onwa Sepụtemba afọ 2025 maka n'ihi ebubo ime mpụ iyi ndụ egwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria n'agha ịchọ nnwereonwe Biafra.

Dịka otu afọ gachara, Ekpa gbara akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị dị na Finland megide ikpe ahụ e jiri tụọ ya mkpọrọ.

Ụlọikpe mkpegharị nọrọ n'ọnwa Ọktoba afọ 2026 lebagharịa anya n'ikpe ahụ ma kpebie ibelata afọ isii e nyere Ekpa ka ọ bụrụzie afọ anọ ka ọ ga-anọ.

Mana ọ nọzubeghi afọ anọ ahụ tupu akụkọ na a tọhapụla ya amalite iwu na soshal midia.