Akụkọ dị mkpa - Julaị 1, 2026
Akụkọ dị mkpa - Julaị 1, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisi otu March and March Movement ekwuola na ha ga-aga n'ihu na-eme ngagharịiwe ruo mgbe gọọmenti ga-ewepụta iwu siri ike megide ndị mbịarambịa bi na mba Saụt Afrịka n'ụzọ iwu megidere.
- Jacinta Ngobese-Zuma kwuru na ndị ntoroọbịa Saụt Afrịka ga-aga n'ihu na-eme ngagharịiwe kwa ụbọchị Tọzde ọbụla n'ime ọnwa isii na-abịa abịa iji manye gọọmenti ikpochapụ ndị niile bi na mba ha n'ụzọ iwu na-akwadoghị.
- N'aka nke ọzọ, Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha ga-achọ ka mba Saụt Afrịka kwuo ego iti aka n'obi nye ndị Naịjirịa niile hapụrụ ọrụ ha, azụmaahịa ha na ngwongwo ha gbaa ọsọ ndụ n'ihi nwakpo e mere ha na mba ahụ.
- Gọọmenti Legọs Steeti ekwuola ka onye niile dere duu dịka ha na-agba mbọ ịchọpụta ụzọ ha ga-esi gboo nsogbu idemmiri na-akpa mkpamkpa na steeti ahụ ugbua n'ihi nnukwu mmiri ozuzo.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






