Nkwarụ 'Scoliosis' na-akarị n'ụmụnwaanyị karia n'ụmụnwoke

Aha onyonyo, Nkwarụ 'Scoliosis' na-akarị n'ụmụnwaanyị karia n'ụmụnwoke
Nkwarụ 'Scoliosis' na-akarị n'ụmụnwaanyị karia n'ụmụnwoke
Mgbe e biputara ya

Dọkịnta ụmụaka bụ Basil Anaele, akpọkuola ndị nne na nna nakwa ndị nkuzi ka ha na-elebanyere ụmụaka ha anya iji chọpụta nkwarụ azụ a na-akpọ 'Scoliosis' n'oge.

Ọ gwara BBC News Igbo oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, na achọpụtaghi nkwaru ahu n'oge nwere ike ibute nsogbu ahụike ndị ọzọ.

Dọkịnta Anaele kọwara na 'Scoliosis' bụ ọnọdụ ebe ọkpụkpụ azụ mmadụ na-agbagọ n'akụkụ, na-adịkarị ka mkpụrụ edemede "S".

Ọ sịrị na a na-achọpụta ya ọtụtụ mgbe n'etiti afọ 10 na afọ 15, oge ụmụaka na-etolite ngwa ngwa.

O kwuru n'ọrịa a na-akarị n'ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke.

Dọkịnta Anaele kọwara na a maghị kpọmkwem ihe na-ebute nkwarụ 'Scoliosis'.

Ọ dọrọ aka na ntị na ọ buru na-achoputaghi ya, malite ọgwụgwọ ya n'oge, nkwaru ahu a nwere ike ịka njọ ma metụta akụkụ ime ahụ ndị ọzọ.

Banyere ime na ọmụmụ nwa, o kwuru na ụmụnwaanyị nwere 'Scoliosis' nwere ike ịtụ ime ma mụọ ụmụ gbasịrị ike.

Ọ gbakwụnyere na ndị nkwarụ nke ha karịrị akarị nwere ike inwe mgbu n'oge ime, ma n'ọnọdụ ụfọdụ, a pụrụ ịwa ha afọ iji mụọ nwa.

Ọ dụrụ ụmụnwaanyị nwere 'Scoliosis' ọdụ ka ha kpọtụrụ dọkịnta ọmụmụ tupu ha atụ ime, ka e nwee atụmatụ nlekọta kwesịrị ekwesị maka ime na ọmụmụ nwa.