Ndị uweojii anwuchiela nwaanyị dị afọ 36 maka ebubo iji ụmụaka eme ihe nkiri ndị gbaọtọ

Ebe foto si, Anambra State Police Command/Facebook
Akụkọ na-asọ ntị oyi mere n'Onịcha dị n'Anambra steeti, ebe ndị uweojii Anambra steeti kwuru na ha anwuchiela otu nwaanyị dị afọ iri atọ na isii a na-enyo enyo maka ebubo metụtara imetọ ụmụaka site na igosi foto na onyonyo mmekọahụ ụmụaka a kpọrọ "Child Pornohraphy".
N'ozi ndị uweojii wepụtara n'akara soshal midịa ya nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga binyereaka, kọwara na ndị ọrụ ha hụtara onyonyo na-efesasị n'ịntanetị bụ nke gosiri ebe otu nwaanyị ji akụrụngwa mmekọahụ bụ 'sex toy' n'olu Bekee emetọ nwatakịrị.
Ikenga kọwara na ndị uweojii nwetara ozi na nwaanyị ahụ aha bụ Aṅụlika Onyeanusia ji akụrụngwa ịkwa iko nke bekee kpọrọ "sex toys" were emepụta ihe onyonyo ya ụmụaka n'eme.
Dịka Ikenga siri kwuo, ndị uweojii napụtakwara ụmụaka anọ nọ na-agbata afọ abụọ, atọ, isii na itoolu na ọtụtụ akụrụngwa e ji enwe mmekọahụ.
N'okwu ya, "Anyị ejidela nwaanyị ahụ ugbua. Anyị chere na e nwere ike ọ bụghị naani nwaanyị ahụ na-akpa ya bụ arụ. Anyị amalitela ime nnyocha ka anyị chọpụta ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ," ka Ikenga kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii jidekwara di nwaanyị iji gbaa ajụjụ ọnụ maka ha mata na ọ ma maka ihe ndị ahụ e boro nwunye ya ebubo na ọ na-eme.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
N'okwu ya, kọmishọna ndị uweojii n'Anambra steeti bụ CP Nnanna Oji Amah gbarụrụ ihu maka akụkọ ọjọọ ahụ ma kwuo na akparamaagwa nwaanyị ahụ n'awụ akpata oyi n'ihi na ọ bụ iwu gbasara mmegbu ụmụaka ka o megidere.
Amah gara n'ihu nye ntuziaka ka e nye ụmụaka ndị azọpụtara n'aka nwaanyị ahụ ezi nchekwa na nleta anya zuru oke.
O kwuru na na ha na ndị otu gọọmenti na ndị ọzọ ọ dị n'aka, ga-ejikọ aka ọnụ ihụ na echekwara ụmụaka ahụ nke ọma ma hụkwa na ha nwetere ezi ndụmọdụ zuru oke bụ nke ga-enyere ha aka ịnata ọgwụgwọ.
Amah kwere nkwa na njirimara na ndụ nke onwe ụmụaka ndị ahụ ka abụ ihe ndị uweojii ga-echekwa mgbe nnoycha na ikpe ahụ na-aga n'ihu.
O kelekwara ndị mgbasa ozi 'Bloggers', ndị ọrụ nchekwa obodo na ndị agbata obi wetara mkpesa ahụ mere ndị uweoji jiri mata ihe na-eme.





























