Ihe Gọọmenti Naịjirịa kwuru dịka e gburu James Uchechukwu na Bishọp Taiwo Michael Fakunle na mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Naịjirịa akọtọọla etu e si gbuo ụmụ amaala Naịjirịa abụọ aha ha bụ Bishọp Taiwo Michael Fakunle na James Uchechukwu na mba Saụt Afrịka.
Gọọmenti Naịjirịa mere ka a mata nke a site n'ozi ụlọọrụ mịnịstịrị na-ahụ maka mmekọ mba na mba ọzọ.
Nke a na-eme dịka ngagharịiwe na mkpagbu ndị mbịarambịa na-aga n'ihu na mba Saụt Afrịka.
Mana gọọmenti Naịjirịa kọwara ozi banyere ọnụ mmadụ abụọ a ndị a dịka ihe nwute.
Etu e si gbuo Bishọp Taiwo Michael Fakunle na James Uchechukwu
E gburu Bishọp Taiwo Michael Fakunle n'ụlọ ya dị na Kensington, Johannesburg, na mba Saụt Afrịka.
E gburu Taiwo Michael Fakunle n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Septemba 2026.
Mana ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gburu James Uchechukwu Nwankwo mgbe ha na-ajụ ya ajụjụ.
Ụlọọrụ nchekwa gburu James Uchechukwu Nwankwo bụ ndị a na-akpọ SAPs (South African Police Service (SAPS).
SAPS gburu Uchekwukwu na Sommerset, dị na Cape Town, n'abalị ise nke ọnwa Septemba, 2026.

Ebe foto si, Getty Images/ Screengrab
Ihe gọọmentị Naịjịrịa chọrọ ka mba Saụt Afrịka mee
Dịka gọọmenti Naịjirịa kọwara ihe mere ka ihe ka ihe na-amapụ obi ha sị "kedụ ka ndị ọrụ nkwecha obodo na iwu obodo ọrụ ha bụ ichekwa ihe nwata na ndụ so na ndị aka ha dị n'ime ka ọnọdụ ndị mmadụ na-akawanye njọ".
Ha katọrọ etu nwa afọ Naịjirịa si nwụọ n'oge a na-agba ya ajụjụ ọnụ na Saụt Afrịka.
Ha sị gọọmenti mba Saụt Afrịka ka ha bidi ime nnyocha maka ihe butere ọnwụ Bishọp Taiwo Michael Fakunle na James Uchechukwu na mba ha.
"Gọọmenti Naịjirịa na-atụ anya na mba Saụt Afrịka ga-etinye anya n'ihe a mere dịka ha kwesiri itinye".





























