Ihe mgbaama na-egosi na ahụike uche onye nke gị chọrọ enyemaka

Aha onyonyo, Ihe mgbaama na-egosi na ahụike uche onye nke gị chọrọ enyemaka
Ihe mgbaama na-egosi na ahụike uche onye nke gị chọrọ enyemaka
Mgbe e biputara ya

Ndị ọkachamara na-ahụ maka ahụike uche ekwupụtala ọtụtụ ihe mgbaama ndị na-enwe nsogbu ahụike uche ga-egosipụta ga-agwa ndị ezinụlọ ha na oge eruola ịga chọọ enyemaka ndị ọkachamara tupu ọnọdụ ha akawanye njọ.

Donatus Okafor bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka akparamagwa mmadụ kwuru na ezinụlọ kwesịrị ịkpọtụrụ dọkịta ma ọ bụrụ na onye ha hụrụ n'anya malite igosi ụzọ omume asaa gụnyere:

Nke mbụ, onye ị hụrụ n'anya malite igosi mwute maọbụ enweghị olileanya ruo ọtụtụ izu.

Nke abụọ, onye ahụ kwụsị ikwurịta okwu maọbụ mmekọrịta ya na ndị ọzọ.

Nke atọ, ọ bụrụ na onye ahụ na-ewe iwe dị ukwuu maọbụ na-eme ihe ike na-enweghị ihe doro anya kpatara ya.

Nke anọ, ndị ọkachamara kwukwara na onye ahụ kwuwe okwu na-enweghị isi, maọbụ ikwu na ọ na-ahụ maọbụ na-anụ ihe ndị mmadụ ọzọ na-adịghị ahụ maọbụ anụ.

Nke ise, onye ị hụrụ n'anya malite ileghara ịdị ọcha onwe ya anya, dịka ịsa ahụ na ịsacha ọnụ, maọbụ jụ ihi ụra na iri nri, nke a pụtara na ugo eberela na mgbagbu.

Nke isii, onye ahụ ga na-aṅu oke mmanya maọbụ na-eji ọgwụike eme ihe.

Ọzọ dịka ibe ya bu onye ahụ ikwu okwu na-egosi na ndụ adịzighị ya mkpa maọbụ na ọ ga-akara ya mma ma ọ nwụrụ anwụ.

Okafor gara n'ihu kwuo na otu n'ime ihe na-eme ka ọtụtụ ndị ọrịa ghara ịgbake ngwangwa bụ na ọtụtụ ezinụlọ na-eche ruo mgbe ọnọdụ ahụ jọrọ njọ nke ukwuu tupu ha eburu onye ahụ gawa ụlọọgwụ maọbụ hụ onye ọkachamara ahụike uche.

Ọ rụtụrụ aka na nsogbu ahụike uche na-achọ ka a chọpụta ya maọbụ malite ọgwụgwọ ya n'oge n'ihi na e mee ngwangwa e meghara ọdachi.