Tems, Burna Boy, Wiskid na ụmụafọ Nigeria ndị ọzọ a họpụtara maka nrite 'Grammy' nke afọ 2027

Ndị otiegwu a ma ama gụnyere Tems, Burna Boy na Wiskid
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onye otiegwu a ma ama na Nigeria bụ Tems ga-eso ndị otiegwu ukwu n'ụwa niile gụnyere otiegwu Beyoncé n'asọmpi maka onye ga-abụ ọkaibe n'egwu 'Best R&B Solo Performance' dịka o nwetara nhọpụta n'ọtụtụ ngalaba ndị ọzọ.

Nke a na-abịa dịka a họpụtara ya na ngalaba anọ maka nkwanye ugwu na ngalaba gụnyere Abọm Egwu Ụwa 'Global Music Album' na Ngosipụta Egwu Africa bụ 'African Music Performance' n'olu Bekee.

Ụmụafọ Nigeria ndị ọzọ ahọpụtakwara gụnyere Burna Boy maka egwu o so Shakira gụọ, Wizkid, Asake, na Ayra Starr.

Grammy wepụtara akwụkwọ ndekọ nhọpụta nke ihe nrite maka nkwanye ugwu ndị otiegwu, ma kwuo na a ga-eme emume Grammy n'ụbọchị 7 n'ọnwa Febụwarị, 2027.

Kedụ ndị otiegwu a họpụtara maka nrite 'Best R&B Solo Performance'?

Ndị a họpụtara maka nkwanye ugwu 'Best R&B Solo Performance' gụnyere:

* Beyonce maka egwu "MORNING DEW (DONK)".

* Kehlani maka egwu "OUT THE WINDOW".

* Victoria Monet maka egwu "LET ME".

* Jill Scott maka egwu "PRESSHA".

* Tems maka egwu "WHAT YOU NEED" .

Ngalaba Best R&B Song

Ndị a họputara na ngala a gụnyere egwu ndị a:

* Let Me

* My Muse

* Out The Window

* Pressha

* What You Need

Ngala abọm kachasị mma 'Best R&B Album'

Ndị a họpụtara maka nkwanye ugwu na ngalaba a gụnyere:

* Otiegwu Chris Brown maka egwu 'BROWN' nke bụ (The Chocolate Edition).

* Alex Isley maka egwu 'When The City Sleeps'.

* Otiegwu Kehlani maka Kehlani.

* PJ Morton maka egwu 'Saturday Night'.

* Otiegwu Jill Scott maka egwu 'To Whom This May Concern'.

Ngalaba 'Best Traditional R&B Performance'

Ndị otiegwu a họpụtara maka ihe nrite a gụnyere:

* Otiegwu Durand Bernarr maka egwu 'I Found Myself'.

* Otiegwu Lalah Hathaway maka egwu 'Can't Let Go'.

* Jill Scott maka egwu 'Beautiful People'.

* Leon Thomas maka egwu 'My Muse.

* The Womack Sisters maka egwu 'If I Let You'.

Ngalaba 'Best Global Music Album'

Ndị otiegwu a họputara maka nkwanye ugwu a gụnyere:

* Otiegwu Anitta maka egwu 'EQUILIBRIVM'.

* Otiegwu Davido maka egwu 'Oriadé'.

* Angélique Kidjo maka egwu 'HOPE'.

* Otiegwu Ayra Starr maka egwu 'Starrgirl'.

* Tems maka egwu 'Love Is A Kingdom'.

Ngalaba 'Best African Music Performance'

Ndị otiegwu a họpụtara na ngalaba a gụnyere:

* Otiegwu Asake maka egwu Gratitude.

* Angélique Kidjo & Ayra Starr maka egwu 'Aye Kan' (Are You Coming Back?).

* King Ayisoba nke ya na Rocky Dawuni jikọrọ aka gụọ egwu 'No Tradition, No Africa'.

* Otiegwu Tems maka egwu 'Big Daddy'.

* Wizkid & Asake maka egwu 'Jogodo'.

Ngalaba 'Best Global Music Performance'

Ndị otiegwu a họpụtara ga-erite nkwanye ugwu na ngalaba a gụnyere:

* Devan Ekambaram ya na Susha maka egwu 'Varuvaaiy'.

* KerreKe, Mireya, Alex E. Chávez maka egwu 'Una Flor En Cada Estrella'.

* Angélique Kidjo na Pharrell Williams nakwa QuavoBando maka egwu 'Orchestral'.

* ROSALÍA na Dougie F maka egwu 'Porcelana'.

* Shakira na Burna Boy maka egwu 'Dai Dai'.