Gịnị bụ 'Ba ma yi' ndị mmadụ na-eti na-ewute ndị pati APC?

Ebe foto si, Bola Tinubu/X
- Onye dere ya, Abdullahi Bello Diginza
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
N'oge na-adịbeghị anya, onyonyoo na foto na -efesa gosiri ebe ndị mmadụ na-eti mkpu megide ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria na mmemme ọha.
Otu n'ime onyonyoo ahụ bụ nke metụtara Onyeisiala Bola Tinubu gosiri ebe ndị mmadụ na-eti 'Ba ma yi' n'asụsụ Hausa megide Onyeisiala Tinubu n'ụlọ okpukperechi Alakụba n'ụbọchị Fraịde nke izu gara aga n'Abuja.
Mgbe nke ahụ mechara, ndị ọrụ nchekwa jidere ihe karịrị mmadụ 70 maka ebubo na ha na-eti mkpu mgbe Onyeisiala Tinubu na-apụ n'ụlọ okpukperechi Alakụba ahụ, mana Onyeisiala Tinubu nyere ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha tọhapụ ndị ahụ ha jidere.
Ọtụtụ oge, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ebo ibe ha ebubo na ha na-akpa nkata ma ọ bụ na-ahazi mwakpo iji gbochie ịnụ ọkụ n'obi ha n'oge achụmnta vootu ha.
Cheta na pati APC na-achị na Nigeriz boro ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ADC na NDC ebubo na ha na-ahazi ụdị mwakpo dị otu ahụ.
N'okwu ọnụ na-ekwuru otu achụmnta vootu onyeisiala nke pati ahụ bụ Dele Alake, wepụtara, o boro ndị otu na-anọghị n'ọchịchị ebubo na ha na-akwado ndị na-eti mkpu megide ya n'oge achụmnta vootu ha.
Gịnị bụ 'Ba ma yi'?
'Ba ma yi' pụtara 'we don't do it' n'olu Bekee, 'anyị anaghị eme' bụ ahịrịokwu nke na-egosi enweghị nkwado n'ebe onye na-agwa ha okwu nọ.
Ọkammụta Kamilu Sani Fagge bụ onye nkụzi na ngalaba sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Bayero University, Kano, nakwa onye na-akọwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria, kwuru na ọ bụ ahịrịokwu ndị Hausa nke pụtara "anyị anaghị akwado gị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị."
O kwukwara na, "Anyị anaghị eme ya" bụkwa atụmatụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ndị mmadụ ji egosi na ndị ha na-agwa ya agaghị enwete akwado ndị ha na-agwa okwu.
"Ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa n'ihu na-eti mkpu 'mba! mba!' nye onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'oge achụmnta vootu, nke a nwere ike ịbụ ihe ịrịba ama na-egosi enweghị mmasị n'ihu ọha n'ebe onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nọ," ka ọkammụta ahụ kwuru.
Kamilu kwuru na n'ihe gbasara sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a na-akpọ nke a nnupụisi ndị ga-atụ vootu.
O kwukwara na a hụbeghị ụdị ngosi iwe ahụ na Nigeria mbụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ihe pati ADC da NDC kwuru
Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ADC na NDC agọnahụla ebubo a, ma kwuo na ha enweghị aka n'atụmatụ nzuzo ọ bụla megide Tinubu na pati APC.
Ndị otu ndị a kwuru na ndị na-eti mkpu ahụ bụ ndị na-egosipụta enweghị afọ ojuju n'ihe gbasara usoro ọchịchị Tinubu.
Otu n'ime ndị na-ekwuru pati ADC bụ Faisal Kabir, kwuru na mkpu ndị ahụ sitere n'ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'ihi atụmatụ ọchịchị Tinubu na pati APC.
Na mkparịtaụka ya na BBC ka Faisal Kabir kọwara na agụụ, ịda ogbenye, na ahụhụ ndị mmadụ na-agabiga bụ ihe kpatara mkpesa ha na-eme.
N'aka nke ọzọ, onyeisi otu achụmnta vootu nke pati NDC bụ Ibrahim Hussaini Abdulkarim kwuru na ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-anọghị n'ọchịchị enweghị aka n'okwu a.
Ọ gara n'ihu kwuo na okwu ahụ bụ nke dị n'etiti pati APC na ọha mmadụ ndị tinyere ha n'ọchịchị.
O boro ọchịchị Tinubu ebubo na ha na-ewepụtara usoro ndị kpatara ahụhụ nye ụmụafọ, nke o kwuru na ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji na-eti ya bụ mkpu iwe.
Kedụ etu iti mkpu 'Ba ma yi' ga-esi metụta ọha mmadụ?
Ọkammụta Fagge kwuru na omume a na-egosi na ha akwụghị n'akụkụ ndị mkpu ahụ metụtara.
O kwukwara na mgbe ọ bụla a na-eji ụdị usoro ahụ emegide onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na o kwesịrị ka onye nọdụ ala ma nyochaa ihe kpatara e ji mee ya ihe ahụ, ma dozie maọbụ gbanwee ọnọdụ ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na nke ahụ gosikwara na o nwereike ọ bụghị onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ga-emeri ntuliaka, ọkacha n'ebe a na-eti mkpu ahụ.
Ọkachamara ahụ kwuru na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla a na-eme ihe dị otu ahụ kwesịrị ịmụta ihe na ya ma dozie ihe ndị nkatọ na-ebo ya iji zere ịdaba n'ọnya ha n'ụbọchị ntuliaka.




























