Charlie Kirk: Onye bụdị Uju Anya aha ya na-akpọtụ maka ịkwa onye nwụrụ anwụ emo

Ebe foto si, Uju Anya/ Facebook
Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla onye ọkammụta mahadum Uju Anya na mba Amerịka maka ebubo ịgbasa ozi ịkpa oke agbụrụ na ịkwa onye nwụrụ anwụ emo.
Uju Anya bụ ọkammụta na-akụzi banyere mmụta asụsụ ọzọ na agbụrụ a nakpọ (second language acquisition and race) na mahadum 'Carnegie Mellon University' maka iwepụta ozi n'akara soshal mịdịa ya n'ọbaozi X ebe ọ na-akwa onye ọlụọgụ maka ikike dịịrị onye nke Amerịka bụ Charlie Kirk emo.
A gbagburu Kirk n'abalị 10 nke ọnwa Septemba afọ 2026 dịka ọ na-ekwu okwu n'ọha na mahadum 'Utah Valley University (UVU).
Mana n'ozi Anya wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Fraide, abalị iri na otu nke ọnwa Septemba, 2026 tupu e wepụ ihe o dere n'ọbaozi X ya bụ ebe o kpere ekpere ka mkpuruobi ya ghara izu ike na ndọkwa.
Nke a na-abịa dịka e mere mmemme ncheta otu afọ Charlie Kirk nwụrụ.

Ebe foto si, Charlie Kirk
Ozi ahụ nke fesara ka ọkụ ụgụrụ na sohal midia kpalitere iwe ọtụtụ ndị Amerịka gụnyere onye nwe ọbaozi X bụ Elon Musk so ndị katọrọ ihe o dere dịka ha hụtara ya ka okwu na-egosi ịkpa oke agbụrụ ma na-arụtụaka na Anya nakwakarị ndị ọcha emo n'ọnwụ.
Ha na-ajụ na mahadum Carnegie Mellon University dị n'Amerịka bụ ebe Anya na-akụzi nkuzi amakwa ihe ọ odere n'ọba ozi ya maọbụ ha akwadoro ya n'ihe o na-eme.
Mana mahadum ahụ gbarụrụ ihu maka ozi ndị ahụ Anya zipụtara n'akara ya n'ọba ozi X, ma kwuo sị na o megidere iwu mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'ogige ụlọakwụkwọ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nke a abụghị mbụ Anya na-akusu anwụ
Nke a abụghị mbụ Anya na-ewepụta ozi ịkwa onye nọ n'ihe ụfụ emo.
N'afọ 2024, Anya ewepụbuola ozi yiri ya oge onye ntaakụkọ a ma ama bụ Rush Limbaugh.
N'afọ Septemba 8, 2022, Anya kwara Ezenwaanyi Elizabeth emo dịka akụkọ kwuru na Ezenwaanyị mba Briten na-arịa ahụ.
Onye bụdị Uju Anya?

Ebe foto si, Uju Anya
Uju Anya bụ onye nkuzi na ngalaba 'Department of Languages, Cultures & Applied Linguistics' bụ ebe ọ na-akụzi mmụta asụsụ abụghị nke eji mụọ onye (Second Language Acquisition.)
Ọ kụziela na mahadum na-ada úda díka 'Penn State University', nakwa 'University of Southern California', Penn State University na Dartmouth College.
Anya edeela ọtụtụ akwụkwọ gunyere, 'Racialized identities in second language learning: Speaking blackness in Brazil' (Routledge 2017) nke ritere nzere '2019 American Association for Applied Linguistics First Book.'
Anya lúrú dí mana ya na di ya gbasara n'afó 2021.#
O mechara lụọ nwaanyị ibe ya n'afọ 2024.

Ebe foto si, Uju Anya






























