FUTO Owerri: Etu ndị ntọ si wakpoo ogige mahadum, gbagbuo otu nwoke, tọọrọ ụmụakwụkwọ abụọ

Ebe foto si, Futo/BBC
Ndị uweojii n'Imo steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala ịchọpọta ndị aka ha dị na ntọrị ụmụakwụkwọ mahadum 'Federal University of Technology Owerri' (FUTO) ma gbuo otu nwoke onyeisi na ngalaba ụlọọrụ ụlọakụ n'ogige ụlọakwụkwọ ahụ na nsonso a.
Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ntọ wakporo ogige mahadum FUTO ụbọchiụka, gbagbuo otu nwoke bụ onyeisi ngalaba ụlọakụ e nyere aha ya dịka 'Maazị 'Ossy' ma tọọrọ ụmụakwụkwọ mahadum ahụ abụọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ mkpamkpa mere n'ezie ma kwụọ na-aha na-achị ndị mkpara mkpamkpa ahu.
Okoye sịrị, "Anyị amalitela ịchụ nta ndị gburu otu nwoke ma tọọrọ ụmụakwụkwọ mmadụ abụọ ka anyị zọpụta ndị ha tọọrọ ma gbochie ụdị ihe ahụ ime ọzọ."
Ọ gara n'ihu kwuo na Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ na ndịisi ụlọakwụkwọ ahụ enweeela ọgbakọ ma kpa maka ihe mere."
Ụlọntaakụkọ Punch kwuru na nwoke e gburu gara ibughachi ụmụ ya na-agụ na mahadum ahụ ụlọakwụkwọ mgbe ndị ntọ gbalịrị ịtọrọ ya, ma gbagbuo ya.
Na nsonso a, ntọ na mpụ dị iche iche gụnyere nzogbu ndị otu nzuzo na-arị elu na nso nso a n'obodo ndị gbara ya gburgburu dịka Ihiagwa, Eziobodo, Obinze, na Nekede.























