Mahadum Nigeria nke Nsukka akọwaala ihe a na-eche gburu ụmụakwụkwọ ha anọ

Ebe foto si, UNN/Facebook
Mahadum University of Nigeria Nsukka ewepụtala ozi banyere ihe ha chere gburu ụmụakwụkwọ ha nọ n'ihe onyonyo ahụ fesara na soshal midia.
Ozi onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Simon Ortunaya wepụtara, kọwara na ụmụakwụkwọ mahadum ahụ dị iri n'ọnụọgụgu gara soro otu nwataakwụkwọ ibe ha gụchara mahadum kporie ndụ n'ụbọchị Wenezde 11 Nọvemba 2026.
Ọkammụta Ortuanya kwuru na ụmụakwụkwọ anọ n'ime ha nwụrụ dịka ha ṅụchara ihe a na-enye enyo na ọ bụ mmanya na-aba n'anya nakwa ọgwụike ebe ụmụakwụkwọ isii ndị nke ọzọ, ka nọ n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ.
N'ihi nke a ka mahadum ahụ ji wepụta abalị atọ maka iru uju n'isi ụmụakwụkwọ anọ ahụ nwụrụ anwụ.
Ọkammụta Ortuanya kwuru na a gaghị enwe nkụzi ọbụla maọbụ emume ọbụla na mahadum ahụ n'ime abalị atọ a.
Ozi ahụ gara n'ihu machie emume mkpori ndụ ọbụla ụmụakwụkwọ UNN na-eme dịka ha gụchara mahadum.
Ọ gara kwuo na ọnwụ ụmụakwụkwọ anọ dị ezi mwute ma gaa n'ihu zigara ezinaụlọ ha ozi iti aka n'obi.
Dịka akụkọ na-efegharị na ụmụakwụkwọ niile nọ n'otu klasị, Ọkammụta Ortuanya kwuru na nke a abụghị eziokwu ma kwuo na ha na-agụ ihe dị iche iche na mahadum UNN.
Ọkammụta Ortuanya kwuru na mahadum ahụ na ndị ọrụ nchekwa na-arụkọ ọrụ ma na-eme nnyocha iji chọpụta kpọmkwem etu ihe a si mee nakwa ihe butere ọnwụ ụmụakwụkwọ anọ a.
Etu akụkọ a si malite

Ebe foto si, UNN/Web
Akụkọ malitere ifegharị na ụmụakwụkwọ na-agụ 'Pharmacy' na University of Nigeria Nsukka (UNN) nwụrụ ka ha mechara oriri na nkwari.
Akụkọ ahụ na-efesasị na social midịa na-ekwu na ndị nwụrụ ruru mmadụ asaa yana ha bụ ụmụakwụkwọ na-agụ Pharmacy na mahadum UNN.
Ọzọ bụ na ọdachi ahụ mere n'oge ụmụakwụkwọ ahụ mere oriri na nkwari maka na ha agụchaala akwụkwọ.
Akụkọ na-ekwu na ndị ahụ nwụrụ ka ha mechara oriri n'ime abalị mana ka chi foro ihe ruru mmadụ asaa n'ime ha tọgbọrọ n'ozu.
Mana n'ozi otu jikọrọ ụmụakwụkwọ Pharmacy na mahadum UNN bụ 'Pharmaceutical Association of Nigeria Students (PANS) wepụtara ka ha kọwara na ndị ahụ abụghị ụmụakwụkwọ na-agụ 'Pharmacy' na mahadum UNN.
Ha gara n'ihu kwuo na ihe ahụ mere n'ebe a na-akpọ 'End in Praise Lodge, Hilltop, dị na Nsukka, Enugu state.

Ebe foto si, UNN/web
N'akwụkwọ ozi nke onyeisi otu ụmụakwụkwọ ahụ bụ Onah Olisaemeka na odeakwụkwọ ya bụ Obasi Chibuike binyereaka, ka ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Maduadizie Gregory kwuru na ha gara njem nleta n'ụlọọgwụ Faith Foundation Hospital ebe e dobere ozu ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị abụọ n'ọba ozu, iji chọpụta nke bụ eziokwu.
O kwuru na ha lechara ndị ahụ nwụrụ anwụ anya mana onweghị onye n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ ngalaba Pharmacy so na ndị nwụrụ anwụ.
"Nnoycha m mere maka ndị ihe ọjọọ ahụ metụtara, gosiri mmadụ abụọ ndị a ma ama n'akara soshal midịa nke mahadum UNN, bụ ndị a maara dịka Rymez, onye na-eme onyonyoo n'okporoụzọ yana Golden bụkwa na-eme ihe ngosi ịgba egwu na soshal midịa," ka o kwuru.
O gara n'ihu kwuo na ghọtara nchegbu akụkọ ọjọọ na-enwe na ndụ ndị ezinaụlọ, ndị enyi and ụmụakwụkwọ mahadum ahụ.
O nyere ndị mmadụ ndụmọdụ maka ibelata ibughara akụkọ ụghba, ma kwuo na ha ga-agba mbọ iji ahụ na ha gbasara ozi ha chọpụtara banyere ọnwụ mmadụ asaa ahụ.




























