Ihe anyị ma maka ọtụtụ mmadụ a sị nwụrụ dịka ha kuuru mmanụ agbịdị na Rivas Steeti

Ndị na-eme njem n'elu mmiri na Niger-Delta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-eme njem n'elu mmiri na 'Niger-Delta', ọ bụghị foto ebe ihe mere
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Rivas Steeti sị na ha na-enyocha etu ọtụtụ ndị mmadụ a mabeghị ọnụọgụgụ ha a na-enyo gara izu mmadụ agbịdị sị nwụọ dịka a sị ha kuuru mmanụ ha gara izu n'Ọkịrịka dị na Rịvas steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rịvas Steeti bụ Blessing Agabe gwara BBC Igbo n'ekwentị sị, "Ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ dịka ha na-achọ izu mmadụ agbịdị n'Ọkịrịka. Nnyọcha na-aga n'ihu iji mata mmadụ ole nwụrụ."

Akụkọ na-efegharị na soshal midịa n'ụbọchị Tọzde kwuru na ihe karịrị ndị "ohi mmanụ" mmadụ 40 kubiri dịka ha kuuru ikuku si na mmanụ agbịdị na Rivas Steeti.

Ụlọntakụkọ 'Nation' ndị kọwara na ọdachi ahụ mere dịka ụgbọmmiri kwụsịrị n'ikperemmiri ịmịrị mmanụ agbịdị ha ga-ebupụ ebupụ ma kwukwaa na a ka na-achọ ụfọdụ ndị ọzọ achọ.

A sị na ndị ntorobịa si n'obodo gbara Ọkịrịka gburugburu wuchiri ebe ahụ a na-amị mmanụ nke iwu na-akwadoghị ịmị mmanụ ma malite ịda dịka ikuku mmanụ kubara ha n'imi.