Kedụ ebe Onyeisiala Bola Tinubu nọ?

Ebe foto si, Getty Images
Ogologo ezumike Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ na mba ofesi kemgbe ihe fọrọ obere ka ọbụrụ otu ọnwa gara aga, na-akpalite oke ndọritaụka gbasara ebe ọ nọ, ogologo oge ọ nọrọ na mba ọzọ na ihe Iwu Naịjirịa kwuru banyere nke a.
Tinubu si Naịjirịa pụọ n'ụbọchị 30 Ọgọst 2026 maka ezumike kwa afọ nke Obi ọchịchị kwuru na ọ ga-ewe ihe dịka izu atọ.
Ma ruo taa bụ Mọnde, 28 Septemba, Tinubu alaghachighị, nke pụtara na ọ nọrọla ụbọchị iri abụọ na itoolu n'obodo ọzọ.
Ihe ọzọ kpalitere ajụjụ bụ na Onyeisiala enyefeghị osote ya, bụ Kashim Shettima, ikike ịrụ ọrụ nchịkwa ododo tupu ọ pụọ.
Nke a emeela ka ndị otu ọchịchị, Obi ọchịchị na ndị otu na-agba gọọmenti ukwu na-enwe ndọritaụka banyere ma Tinubu emebiri iwu ka ọ bụ na o mebịghị.
Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga, n'ozi o biputere n'akara X ya n'ụbọchị Sọnde, 27 Septemba 2026, kwuru na Tinubu nọ na ezumike ọrụ maka na o nwere ikike ime nke ahụ.
O kwuru na n'oge teknụzụ dijitalụ a, ọ dịghị mkpa ka Onyeisi ala nọrọ n'Abuja tupu o nwee ike ịrụ ọrụ a họpụtara ya n'afọ 2023.
Nke a emeela ka ọtụtụ ndị jụọ ebe Onyeisiala nọ, ọkachasị ebe ọ dịla ugboro abụọ e yigharịrị ụbọchị ọ ga-alọta.
Mana ọtụtụ ndị Naịjirịa, gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ụfọdụ ndị ọkaiwu, ekwenyechaghị nke ọma n' ozi ahụ.
Ebee ka Onyeisiala Tinubu nọ?

Ebe foto si, Bola Tinubu
Akụkọ na ihe onyonyo Obi ọchịchị bipụtara n'izu ndị gara aga na-egosi na Onyeisiala nọ na France.
Otu n'ime foto ndị ahụ gosiri ebe Tinubu na Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron, nọ na-eri nri abalị n'obi onyeisiala France.
Ihe onyonyo ọzọ gosiri Tinubu, Gọvanọ Ogun Steeti bụ Dapo Abiodun, na onyeisi otu ụlọọrụ mba ọzọ akpọrọ 'DP World', mgbe ha bịanyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta maka mmepe ọdụ ụgbọ mmiri na ebe pụrụ iche maka atụmatụ na azụmahịa akụ na ụba mmiri n'Ogun Steeti.
Dịka ozi si obi ọchịchị gọọmentị siri gosi, ọ pụtara na Tinubu nọ na Paris, ebe ọ na-arụkwa ụfọdụ ọrụ ọchịchị.
N'izu mbụ nke ezumike ya, Tinubu gara London. Mana gọọmentị Naịjirịa ebipụtaghị ozi ọ bụla gbasara ma ọ na-arụ ọrụ ọchịchị site n'ebe ahụ ka ọ bụ na ọ nọ naanị n'ezumike.
Gịnị ka ndị Naịjirịa na-ekwu gbasara ezumike Tinubu?

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kenneth Okonkwo bụ ọnụ na-ekwuchitere otu ndọrọndọrọ ọchichi 'African Democratic Congress', kwuru na Tinubu leghara Iwu Naịjirịa anya site n'enyefeghị osote ya ikike ọrụ dịka Onyeisiala nwa oge tupu ọ gawa ezumike.
Okonkwo kwuru na ihe a na-akpọ 'Ị nọ ọrụ n'ezumike' nke akpọrọ 'Work Vocation' n'asụsụ bekee, adịghị n'Iwu Naịjirịa, n'ihi na okwu ezumike pụtara ịpụ n'ọrụ iji zuru ike.
O kwuru na ebe Tinubu ezigaghị ụlọomeiwu akwụkwọ ozi iji nyefee osote ya ikike, o mebiri iwu.
Ọ gbakwunyere n'ụlọomeiwu dakwara iwu n'ihi na ha akpọghị oku ịtụ vootu iji nye osote onyeisiala ikike ịbụ Onyeisiala nwa oge.
Ọka iwu ọzọ na onye bụbu onyeisi nke ụlọọrụ Nigeria Human Rights Commission bụ Chidi Odinkalu, kwukwara na okwu 'Ị nọ ọrụ n'ezumike' adịghị n'Iwu Naịjirịa.
N'aka nke ọzọ, Daniel Bwala, onye na-ekwukwa okwu n'aha Tinubu, kwuru na okwu 'Ị nọ ọrụ n'ezumike' dị adị, nke pụtara na mmadụ nwere ike ịpụ n'ebe ọ na-arụ ọrụ ma ka na-arụ ọrụ ya.
Bwala kwuru na a na-akpọkwa nke a 'workation', ebe mmadụ na-aga ebe ọzọ maka ezumike ma ka na-arụ ọrụ ọchịchị maọbụ ọrụ ya.
O kwuru na ezumike Iwu Naịjirịa na-ekwu maka ya bụ nke onye ahụ na-enweghị ike ịrụ ọrụ ya.
Dịka o si kwuo, ebe Tinubu ka nwere ike ịrụ ọrụ ya, ọ dịghị ihe ọjọọ o mere.
Bwala kwukwara na iwu ekwesịghị ịkọwa okwu "working vacation" kpọmkwem, n'ihi na ọbụrụ na okwu iwu na-agbagwojụ anya, ọ bụ ọrụ ụlọikpe ịkọwa ihe iwu ahụ pụtara.
Ihe dị otu a emeela mbụ?

Ebe foto si, Presidency
Azịza ajụjụ bụ ee.
N'April 2019, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ na-aga mba United Kingdom maka 'nleta nkeonwe', mana o nyefereghị osote ya bụ Yemi Osinbajo ikike ịrụ ọrụ dịka Onyeisiala nwaoge.
Ọnụ na-ekwuchitere Buhari n'oge ahụ bụ Garba Shehu, kwuru na ọ dịghị mkpa ka Buhari nyefee Osinbajo ikike.

Ebe foto si, Muhammadu Buhari /Facebook
Mana nke a kpatakwara ajụjụ n'etiti ndị Naịjirịa.
Ndị bụbu Onyeisiala Naịjirịa nọrọ ogologo oge na mba ọzọ
Ndị bụbu Onyeisiala, Umaru Yar'Adua na Muhammadu Buhari, bụ ndi nọrọ ogologo oge na mba ọzọ n'oge ọchịchị ha.
Buhari nwere ndekọ kachasị elu n'ihe gbasara ọnụọgụ ụbọchị Onyeisiala Naịjirịa nọrọ na mba ọzọ maka ọgwụgwọ na ihe ndị ọzọ, ọkachasị na London, na mba United Kingdom.
Mana n'adịghị ka ihe na-eme ugbu a, Buhari na-ezigakarị ụlọomeiwu ukwu akwụkwọ ozi iji nyefee osote ya bụ Yemi Osinbajo ikike ịrụ ọrụ dịka Onyeisiala nwaoge mgbe ọ na-anọghị ogologo oge.
N'ọnwa June 2016, Buhari gara London maka ọgwụgwọ ọrịa ntị, ebe ọ nọrọ ụbọchị iri.
Na mbido Jenụwarị rụọ Machị 2017, ọ gara London ọzọ. Ihe malitere dịka ezumike ụbọchị iri mechara bụrụ ụbọchị iri ise n'ihi nsogbu ahụike a na-ekwuputeghị kpọmkwem.
Nke kacha ogologo bịdoro na Mee ruo Ọgọst 2017, mgbe Buhari nọrọ ụbọchị 104 na London maka ihe obi ọchịchị kpọrọ nlekọta ahụike pụrụ iche.
N'oge ahụ, osote onyeisiala Yemi Osinbajo rụrụ ọrụ dịka Onyeisiala nwaoge.
Onye bụbu Onyeisiala Umaru Yar'Adua nọkwara ogologo oge na mba ọzọ site na Nọvemba 2009 ruo Febụwarị 2010.
Obi ọchịchị ekwughị na Yar'Adua na-aga Jeddah na mba Saudi Arabia, maka ọgwụgwọ, ọ nyefeeghịkwa osote ya n'oge ahụ, Goodluck Jonathan, ikike ịrụ ọrụ.
Mana ka Yar'Adua nọrọ ogologo oge na-anọghị n'obodo, ọ kpatara nnukwu esemokwu ndọrọndọrọ ọchịchị, nke mere ndị otu ụlọomeiwu mechara jiri ihe a kpọrọ "Doctrine of Necessity" nye Jonathan ikike ịbụ Onyeisiala nwaoge.
Yar'Adua mechara nwụọ n'ihi ọrịa ahụ, Jonathan wee bụrụ Onyeisiala Naịjirịa.





























