Harrison Anazodo: Ihe mere n'ikpe Ụkọchukwu a nwụchiri maka ebubo ịnapụ ọtụtụ mmadụ nwunye ha

Foto Harrison Anazodo oge ọ nọ n'igwe wheelchair oge e butere ya n'ụlọikpe
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụkọchukwu nwe ụlọụka Dayspring Assembly dị n'Awada, Obosi bụ Harrison Anazodo, bịara Ụlọikpe Ukwu Anambra state dị n'Awka n'oche ịnyịnya igwe n' ụbọchị Monde 28 Septemba, 2026.

A nwụchiri Ụkọchukwu Anazodo n'abali iri nke ọnwa Juun 2026 dịka akụkọ fesara na soshal midia na-ebo ebubo na ya bụ ụkọchụkwu napụrụ ụfọdụ ndị ụka ya nwunye ha nye onye ọzọ maọbụ lụwa ha.

E si n'ụlọọgwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital dị n'Awka isiobodo Anambra state, bute bute Harrison Anazodo n'ụlọikpe nke Ọkaikpe Jude Obiora nọ n'isi ya dịka gọọmentị Anambra state gbara ụkọchukwu ahụ akwụkwọ maka ebubo ịgbasaozi na-akwalite ego mbute bụ nke megidere iwu nchekwa Anambra state nke afọ 2025 a kpọrọ Anambra State Homeland Security Law 2025 n'olu Bekee.

Ebubo ndị ọzọ a na-ebo ya gụnyere igbu mmadụ, ịtọọrọ mmadu maọbụ ịgbasa ezinaụlọ jichie ụfọdụ n'ụlọ ya.

Dịka ụlọikpe si kwuo, Anazodo dara iwu ndị a n'agbata afọ 2002 na afọ 2025.

Ụkọchukwu Anazodo gọnarịrị ma kwuo hoo ha na aka ya dị ọcha n'ebubo asaa ahụ e boro ya.

Ọkaiwu Abonyi na-anọchịteanya Anazodo, rịọrọ ka e nye ya ohere isi n'ụlọ abịa n'ụlọikpe n'ikpe ahụ.

Mana ọkaiwu na-anọchiteanya gọọmenti bụ C. V. Ononye, anabataghị arịrịọ ahụ ma kwuo na e zibeghị ha ozi ahụ etu o kwesịrị maọbụ nye ha ohere ịzaghachi arịrịọ ha.

Ụlọikpe lere ọnọdụ ahụike Ụkọchukwu Anazodo dịka ọ nọọrọla n'ụlọọgwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospita ihe ruru izuụka atọ ma nye iwu ka e bughachi ya n'ụlọọgwụ.

Ụlọikpe gara n'ihu yigharịrị ikpe ya gaa n'ụbọchị Mọnde12 Ọktoba, 2026.