Ihe ndị uweojii kwuru maka okpokoro isi mmadụ 28 a chọtara n'Abia steeti

Ndị uweojii achọtala okpokoro isi mmadụ 28 n’Abia steeti
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Abia steeti kwuru na ha achọtala okpokoro isi mmadụ ruru iri abụọ na asatọ (28) tinyekwara ọkpụkpụ mmadụ n'otu okeọhịa dị na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na ha mere nchọpụta a n'ụbọchị Sọnde 27 Septemba 2026.

N'ozi o wepụtara, Chinaka kwuru na ngalaba ndị uweojii Violent Crime Response Unit (VCRU), Anti-Kidnapping Unit, Anti-Cultism Unit, Intelligence Response Unit (IRU), Rapid Response Squad (RRS) nakwa ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Isuochi jikọtara aka kpaa ike ahụ.

Dịka Chinaka siri kwuo, ọ bụ n'okeọhịa dị n'Isuochi n'okpuru ọchịchị ime obodo Umunneochi dị n'Abia steeti ka ndị uweojii chọtara akụkụ ahụ mmadụ ndị ahụ.

O kwuru na ndị uweojii na-enyo enyo na ọkpụkpụ ndị ahụ bụ nke mmadụ ndị a tọọrọ ma zoo n'ebe mgbazo ndị omekome dị n'okeọhịa Umuaku, Isuochi na Nneato.

Ka ọ dị, Chinaka kọwara na o nwebeghị ndị a nwuchiri, n'ihi na ndị omekome riri mbọmbọ ozugbo ha hụrụ ndị uweojii.