A gbagbuola mmadụ 17 n'ebe a na-aṅụ mmaya na mba South Africa

Foto ndị uweojii South Africa nọ n'ogige ha na-eme nnyocha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii mba South Africa ekwuola na e gbuola ihe ruru mmadụ 17 ebe mmadụ 15 ndị merụrụ ahụ oge ndị ojiegbe gbara egbe n'ogige a na-aṅụ mmanya na mpaghara Gauteng dị na mba South Africa n'abalị Satọde 26 Septemba 2026.

Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na mmadụ 17 ahụ nwụrụ n'ogige ahụ dị na Wedela dị na Johannesburg dịka ndị uweojii kwuru na amaghị ihe bụ ebumnobi ndị bịara gbaa egbe ahụ.

Ndị ahụ nwụrụ gụnyere ụmụnwoke 13 na ụmụnwaanyị anọ ebe mmadụ 15 ahụ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ enweta nleta.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-achọ mmadụ asatọ bu egbe AK-47 nakwa egbe pistol a na-enyo enyo na ọ bụ ha kpara ajọ agwa ahụ.

Akụkọ kwuru na ndị mmadụ na-aṅụ mmaya n'ogige ahụ oge ndị ojiegbe ahụ bịara ma malite ịgba egbe aghara aghara.

Foto ogige ndị uweojii machiri maka nnyocha

Ndị uweojii kwuru na ndị ojiegbe zuuru ụfọdụ ekwentị ndị mmadụ nọ n'ogige ahụ tupu ha banye n'ụgbọala ha na-enweghị akara ọbụla gbaa ọsọ.

Ndị uweojii kwuru na enwebeghị onye ọbụla ha nwụchiri ma kọwaa na nnyocha na-aga n'ihu iji chọpụta ma nwụchie ndị ọbụla aka ha dị n'ajọ agwa a butere ọnwụ mmadụ 17.

Ha kpọrọ oku ka onye ọbụla nwere ozi ga-enyere aka na nnyocha ha na-eme, ka onye dị etu a kpọtụrụ ụlọọrụ ndị uweojii dị ya nso.

Nke a abụghị oge mbụ ụdịrị ihe a na-eme na South Africa. N'izuụka gara aga, e gburu mmadụ mmadụ 11 gụnyere nwaanyị dị ime oge ndị ojiegbe gbara egbe agharaaghara n'otu ụlọ obibi dị na mpaghara ndịda obodo Durban.

Cheta na n'ọnwa Juun 2026, e gburu mmadụ 12 n'ogige obibi dị na Johannesburg.