Prank Videos: Ọghọm dị na iji ụmụaka eme ejije egwuregwu 'prank'

Nwatakịrị nwaanyị ji aka bụọ kpuchie ihu ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'oge na-adịbeghị anya, omume ime onyonyoo egwuregwu aghughọ bu nke ndi bekee kpọrọ 'prank' malitere na mpaghara Andhra Pradesh na Telangana nke mba India.

Ndị mmadụ n'eji ugboala ha iji kwọro umuaka ndi ebumnuche ha bu na mmadu na enyere ha aka, mana ndi a na-agwa umuaka ndi a na a tọọrọ ha. Nke a ga-eme ka umuaka malite ịtu nnukwu ụjọ, tiwe mkpu ma bewekwa akwa.

Ndị na-eme onyonyo ndị a kwuru na ha na-achọ ịkụziri ụmụaka ka ha ghara ịbanye n'ụgbọala nke ndị ha na-amaghị, mana ọtụtụ ndị mmadụ n'intanet katọrọ omume a.

Ugbu a, 'prank' ọzọ amalitela n'ịntanet, ebe ndị nne na nna na-akuwa akwa n'isi ụmụ ha.

E mepụtara ọtụtụ onyonyo n'ụwa niile ma na TikTok ma na Instagram eji akara 'hashtag' bụ '#eggcrackchallenge', nke ọtụtụ ndị mmadụ lere.

Ọtụtụ n'ime ụmụaka ndị a hụrụ n'onyonyo ndị a bụ ụmụaka ka na-etolite etolite maọbụ umuaka afọ ise maọbụ isii.

N'onyonyo ndị a, omume nne na nna umuaka ndi a gbara ụmụ ha gharịị ma mekwa ka anyammiri akwa gba ha ọkachasi oge obula nne ha maọbụ nna kụwara ha akwa n'isi, ụfọdụ na-ebe akwa, ụfọdụ na-eji iwe chụpụ nne na nna ha n'ihu ha.

Nke a na-egosi na omume a anaghi atọ umuaka ndị a ọchi. Nke ka nke bu na nne ha maọbụ nna ha na-ese ha onyonyo oge ha na-akpaso ha ụdị agwa a.

Ndị ọkachamara n'akparamagwa mmadụ ekwuola na ịkpaso ụmụaka agwa dị otu adịghị mma ma ncha maka na umuaka a enweghi ịhe ha na aghọta na ya

Kedu ihe 'prank' putara?

Onye ọkachamara n'akparamagwa mmadụ bụ Rajesh Pandey na Lucknow na-ekwu na 'prank' bụ njakịrị nke a na-eme iji kpaa ọchi

Ndị mmadụ na agbarụ ihu na 'prank' umuaka di n'ime ya n'ihi na oge ụfọdụ ndiiche anaghị adịcha n'etiti ejije 'prank' ndị a na mmegbu.

Ọ na-abụ mmegbu mgbe onye a na-emeso ya enweghị ike ibuli ya maọbu mgbe ọ naghi aghotaghi ihe n'eme.

Mgbe ufọdu ọchi ndi a na-achi mgbe ha na-eme ya bu 'prank' na agba umuaka ndi a obi ọjọọ, maka na omume a na-esiri ha ike ịghọta n'ihi na ha bu ụmụaka na-eto eto.

Otu nsogbu di na 'prank' ndị a bụ na a na-ese ya n'onyonyo ma na-eziga ya n'ịntanetị nke umuaka a na-enweghi ikike ichekwa.

Ajụjụ ọtụtụ ndị ọkachamara na-ajụ bụ, 'olee otu a ga-esi wepu ụdị ejije 'prank' ndị a na-anaghị amasị ụmụaka, ọkachasi ma ọ buru na umuaka ndi a na-emeru ahu oge a na-eme ya bụ 'prank'.

Ndị nchọpụta na-ekwu na ejije egwuregwu 'prank, ndị a na-emetuta umuaka. Otu ihe jọrọ njọ maka ya bụ etu o si emetụta ha n'uche nakwa n'ụbụrụ.

"Ndị nne na nna na-achọ mgbe niile inweta ego nakwa ụgwọọrụ site n'onyonyo 'prank' ndị a, mana ọ naghi agbata ha n'uche ịmata etu ya bụ onyonyo si emetụta ụmụ ha n'ụzọ n'ezighi ezi," ka Melville-Thomas kwuru.

O kwuru na ọtụtụ na-elekwasị anya naani n'ihe ha ga-erite karịa etu obi di ụmụ ha.

Ejije 'prank' ndị a nwere ike inwe mmetụta na-adịghị mma n'ime ụmụaka ma nwee ike imetụta mmekọrịta ha na nne na nna ha nakwa n'etiti ha na ndi ebirị ha.