BBC ewepụtala atụmatụ maka ụmụaka ndị omekome na ịda ogbenye manyere ịkwụsị akwụkwọ na West Africa

Otu nwa agbọghọ yi hijab ojii nke kpuchiri isi ya na elu ahụ ya. O ji nnukwu mkpanaka osisi nke a na-eji egweri ọka millet. Ọ nọ n'ezi, e nwekwara obere ohia na ọkọlọtọ n'azụ ya.
Nkọwa foto, Hadiza kwụsịrị akwụkwọ n'afọ iri na atọ iji lụọ di, ugbu a, ọ ji oge ya arụ ọrụ ụlọ.
    • Onye dere ya, Madina Maishanu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
    • Ebeg o si, Goronyo
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Hadiza dị afọ 15 na-esu ọka 'millet', ma na-agụ mkpụrụedemede Bekee iji chetere onwe ya na ihe ahụ ya chọrọ bụ ịga akwụkwọ.

"Oge ụfọdụ, ana m ede ihe n'ala iji mee kuziri onwe m ma hụ ma mm ka na-ede ihe n'ụzọ ziri ezi," ka ọ na-ekwu.

Otu abalị, ihe dịka afọ abụọ gara aga, ọtụtụ ụmụnwoke so n'otu ojiegbe wakporo obodo ya.

"Ha menyere ehi anyị ụjọọ, o nwee gbapụ, ha wee tọrọ otu nwaagbọghọ. Anyị gbara ọsọ ndụ. Anyị ji ụkwụ efu jee ije ruo ebe a," ka ọ na-ekwu.

Kemgbe ahụ, o bi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Goronyo, nke dị kilomita ole na ole site n'obodo ya.

Ọ gara akwụkwọ ebe a nwa oge, mana n'oge na-adịghị anya, o zutere otu nwaokoroọbịa; mgbe ọ dị afọ 13, ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ wee lụọ di.

"Ọ bụ omenala ebe a na ozugbo nwaagbọghọ lụrụ di, agụmakwụkwọ ya na-akwụsị," ka ọ na-akọwa.

Ugbu a, o bi n'ụlọ ndị ezinụlọ di ya, ma na-enyere aka ilekọta ụlọ ahụ.

Ọ bụ ezie na iwu Nigeria machibidoro alụmdi na nwunye maka ndị na-erubeghị afọ 18, a naghị emezu iwu a mgbe niile.

Aka nwaagbọghọ zoro ezu na-ede mkpụrụedemede 'B' n'ala. A na-ahụkwa akụkụ nke hijab ojii ya, tinyere uwe nwere ụkpụrụ nke nwere nnukwu okooko osisi na-acha akwụkwọ ndụ na odo.
Nkọwa foto, Hadiza na-ede ihe n'ala iji kuziri onwe ya ma gbaa mbọ hụ ma ya chetara etu e si ede mkpụrụedemede Bekee

Hadiza bụ otu n'ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ụmụaka iri na itoolu na Nigeria na-anaghịzi agụ akwụkwọ, dịka atụmatụ Unesco kesara n'afọ 2024.

Nke ahụ bụ ihe dịka otu n'ime ụmụaka anọ nọ n'afọ agụmakwụkwọ na mba ahụ.

N'ihi nke a, BBC World Service ewepụtala Dars Hausa, atụmatụ agụmakwụkwọ n'asụsụ bụ isi a na-asụ na mpaghara ugwu Nigeria, yana Niger, Cameroon na ebe ndị ọzọ dị na West Africa.

Ọ na-ewetara ụmụaka Bekee, mgbakọ na mwepụ na sayensị ihe mmụta n'ofe West Africa, site na soshal midịa, telivishọn mpaghara na redio.

Ọtụtụ mmadụ na mpaghara ahụ na-enweta akụkọ ha site n'akụrụngwa mgbasaozi bụ redio, nke opekatampe ọkara nke ezinụlọ na Nigeria nwere otu ya, dịka ọrụ ebere 'Save the Children' si kwuo.

Dars pụtara "ihe mmụta" n'asụsụ Pashto na Dari, a malitekwara ya n'asụsụ ndị ahụ na 2023 maka ụmụaka Afghanistan a machibidoro ịga akwụkwọ. E mechara nke a na February 2025.

Ihe kpatara ọtụtụ ụmụaka Nigeria ji akwụsị akwụkwọ dị ọtụtụ ma dị mgbagwoju anya. Dịka Hadiza, Rukayya dị afọ iri na abụọ bikwa n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Goronyo.

Foto nwaagbọghọ yi uwe isi na-acha odo odo gbara ọchịchịrị, nọ ọdụ n'ọnụ ụzọ, ma na-ele igwefoto ahụ anya.
Nkọwa foto, Oge e gburu nna Rukayya, ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ kama ọ malitere ịchọ ụzọ isi nweta ego.

"Ọ na-ewute m ịhụ ụmụaka ndị ọzọ ka ha na-agụ ihe ma na-aga akwụkwọ mgbe m na-enweghị ike," ka ọ na-ekwu.

Dịka nwa mbụ, kwa ụbọchị Rukayya na-apụ ịchịkọta nkụ iji ree ma rịọ arịrịọ ka ụmụnne ya ndị obere wee nwee ihe ha ga-eri.

"Ọ bụrụ na nna m dị ndụ, agaghị m apụ apụ ma rịọ arịrịọ," ka ọ na-akọwa, na-ekwu na ụfọdụ ndị na-akwa ya emo "mana ọ naghị egbochi m n'ihi na ọ bụ naanị ụzọ anyị si adị ndụ."

Ndị ohi gburu nna ya ihe dịka otu afọ gara aga n'ihu ya, ka ọ na-ekwu, ezinụlọ ya wee si n'ụlọ ha gbapụ gaa n'ogige ahụ.

Ya na Hadiza so n'ime mmadụ 670,000 nọ n'ebe ugwu ọdịda anyanwụ na mpaghara etiti Nigeria bụ ndị a chụpụrụ n'ụlọ ha n'ihi izu ohi na ịtọrọ mmadụ, dịka otu mbaụwa na-ahụ maka nkwagharị bụ International Organization for Migration si kwuo.

Ọ bụ ụfọdụ ndị otu Islamist na-eme mwakpo, mana ọtụtụ n'ime ha na mpaghara a bụ ndị omekome, ndị a maara na Nigeria dịka ndị ohi, ndị na-egbu ma na-atọrọ mmadụ.

Ụlọakwụkwọ Hadiza gara na Goronyo bụ naanị nke ụmụaka ogige ahụ nwere, ọ na-enwekarị ihe dịka ụmụakwụkwọ iri ise n'otu klas ọ bụla.

Otu n'ime ndị nkuzi bụ Kamilu Sulaiman Jakada, kwuru na ọ bụ ezie na ihe mmụta bụ n'efu, mana naanị obere ọnụgụgụ ụmụaka na-aga, n'ihi na ndị nne na nna na-agwa ya na "ọ bụ ụmụaka bụ ndị na-elekọta ezinaụlọ" na ha kwesịrị ịkpata ego iji rie nri.

Otu nwoke yi uwe ojii n'elu ntutu isi ya dị mkpụmkpụ na-achị ọnụ ọchị. N'akụkụ ya, e nwere bọọdụ nke e dere mkpụrụedemede Bekee n'elu ya na mkpụrụ akwụkwọ ọcha.
Nkọwa foto, Onye nkuzi Kamilu Sulaiman Jakada kwuru na otu ndị ojiegbe, ịda ogbenye, na enweghị ego nwere mmetụta dị ukwuu n'agụmakwụkwọ ụmụaka.

O kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ndị nkuzi ma ọ bụ klaasị zuru oke, na-akọwa na ego anaghị ezu ezu ma ọ bụ na-esikarị n'aka ndị mmadụ na otu dị iche iche ka ego si abịa karịa gọọmentị.

O kwukwara na ihe ịche aka mgba ọzọ bụ mwakpo ndị ojiegbe mere ka ọtụtụ nne na nna kpụọpụ ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ.

Cheta na nwata nwatakịrị ọ bụla nọ na Nigeria kwesịrị inweta agụmakwụkwọ n'efu ruo afọ itoolu - isii n'ime praịmarị na atọ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị. Ọ bụ gọọmentị etiti, steeti na mpaghara na-ekerịta ibu ọrụ.

Na mgbakwunye, ọtụtụ ụmụaka nọ n'usoro agụmakwụkwọ ọdịnala bụ 'Almajiri'—nke na-enye agụmakwụkwọ Alakụba—anaghị akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ na sayensị; n'ihi ya, otu UNICEF na-ewere ha dịka ụmụaka na-agaghị akwụkwọ.

E sere foto ime ụlọ klas site n'azụ ụlọ ahụ. A na-ahụ azụ isi ụmụaka dị ihe dịka iri abụọ na ise, ka ha nọ ọdụ n'oche ha na-ele onye nkuzi guzo n'ihu ụlọ klas ahụ. Onye nkuzi ahụ yi uwe elu ojii. N'azụ ya, mgbidi nwere na-acha aja aja dị nro jupụtara n'akwụkwọ mkpụrụedemede e ji agba ọcha dee.
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọakwụkwọ na Nigeria na-enwe nsogbu ụkọ ndị nkuzi, ụlọ klas, na ihe e ji amụ ihe ihu, n'ihi afọ ndị na-enyeghị ha ego zuru oke nakwa enweghị nlekọta kwesịrị ekwesị.

Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ ọkammụta Suwaiba Sa'id, kwenyere na ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ perempe karịa ka akụkọ kọrọ, mana o kwetara na n'ihi mmụba nke ọnụ ọgụgụ ndị bi na Nigeria, "e meghị itinye ego kwesịrị ekwesị ma ọ bụ mee nlekọta kwesịrị ekwesị... Agaghị m akpọ aha ha, mana anyị maara maka steeti abụọ na-eweghị otu onye nkuzi n'ọrụ ruo afọ asatọ".

O kwuru na na agụmakwụkwọ bụ "ihe kacha mkpa" n'aka gọọmentị, nakwa na atụmatụ ndị dịka 'Lumina' bụ ebum n'obi inye aka dozie nsogbu nke "ileghara ihe anya ruo ọtụtụ iri afọ".

Ọ kwukwara na "gọọmentị na-eme ihe niile o nwere ike" iji lụso ndị ojiegbe emempụ ọgụ, nakwa na "anyị ahụla ụmụaka ndị kwesịrị ịnọ n'ụlọakwụkwọ, mana ha na-etinye aka n'ime mpụ a".

Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ụmụaka dịka Hadiza na Rukayya ka atụmatụ BBC World Service n'asụsụ Hausa na-achọ inyere aka. Hadiza kwuru na ya ka nwere olile anya ịghọ dọkịta n'ọdịnihu, "iji nyere ụmụnwaanyị ibe m aka."

A ga-agbasa 'Dars Hausa' na redio BBC News Hausa n'ụbọchị Sọnde n'elekere 06:45 (oge dị na West Africa), a ga-egosikwa ya ọzọ n'elekere 20:45. A ga-enwekwa ike ịhụ ya site n'elu ikpo okwu dijitalụ nke BBC News Hausa, gụnyere YouTube, Facebook, X, na Instagram.