Inec amalitela itinye mpụtara nnwale ntuliaka n'akụrụngwa IReV

Ụlọọrụ Inec amalitela itinye mpụtara nnwale ntuliaka e mere na mpaghara dị iche iche na Nigeria n'akụrụngwa ịntanetị ha bụ IReV.
Ụlọọrụ ahụ kwuru na n'ime ebe ịtụ vootu puku iri na asaa, narị isii na iri na anọ (17,614) a họpụtara maka nnwale ahụ, na ha etinyela mpụtara ntuliaka ndị e mere n’ebe puku abụọ na iri isii na asatọ (2,068) n’akụrụngwa IReV.
Cheta na e mere nnwale ntuliaka ahụ nke e mere na mba niile n'ụbọchị Satọde, abalị 28 n'ọnwa Nọvemba afọ 2026, site n'elekere 8:30 nke ụtụtụ ruo elekere 2:30 nke ehihie.
Ndị ntaakụkọ BBC News kọrọ na ịtụ vootu akwụsịla na Lagos, isiobodo Abuja, na steeti ndị ọzọ, ebe a malitekwarala ịgụkọ vootu na itinye mpụtara ya n'ịntanetị.


















