Nyesom Wike vs Hope Uzodimma: Ugboro ole Mịnịsta FCT na Gọvanọ Imo Steeti kwakọtarala isi

Gọvanọ Hope Uzodimma na Nyosom Wike
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodimma na Nyesom Wike bụ Mịnịsta na-achịkọta obodo etiti Nigeria bụ Abuja, agbakọrịtala onwe ha egbe ọnụ ọtụtụ oge, n'agbanyeghị na ha abụọ bụcha ndị nkwado Onyeisiala Bola Tinubu dịka ọ na-azọ ọkwa nke ugboro abụọ ya.

Ọ bụ ezie na Wike abụghị onye otu All Progressives Congress (APC) bụ pati Tinubu dịka Gọvanọ Hope Uzodimma nọ na ya, mana Wike so n'otu n'ime ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ọchịchị Onyeisiala Tinubu.

Kama o doro anya na e nweghị ịhụnanya dị n'etiti Wike na Uzodimma, ọ kacha dịka ha abụọ si ahụta ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na achụmnta vootu maka ntuliaka Nigeria ga-adị n'afọ 2027.

Akụkọ a ga-atule ugboro ugboro Wike na Uzodimma tuferela onwe ha okwu n'ihu ọha obodo, ma tulekwaa ihe nwere ike ịkpata esemokwu a.

Ihe mere n'ọnwa Sepụtemba 2026

N'ọnwa Sepụtemba afọ a, Wike katọrọ Uzodimma maka ọnụọgụgụ vootu onyeisiala Tinuburu nwetara n'Imo Steeti na ntuliaka 2023.

Wike kwuru okwu a n'ihi nkatọ Uzodimma katọrọ otu 'Rainbow Coalition' nke Wike hibere na Rivers Steeti iji kwadoo onyeisiala Tinubu nakwa ndị ọzọ na-azọ ọkwa dị icheiche na steeti ahụ na otu ndọrọndọrọ dị icheiche na-abụghị sọ APC.

Mịnịsta FCT jụru ihe kpatara na onyeisiala enwetazughị pasenti ise n'ime vootu niile a tụrụ n'Imo Steeti, ebe ọ bụkwa na gọvanọ Uzodimma na ndị omeiwu steeti ahụ niile bụcha ndị APC ma merikwaa ntuliaka nke ha.

"Onye na-ekwu okwu, ya gosikwa ihe o mepụtara. Mụ onwe m egosila ihe m pụrụ ime site na vootu onyeisiala nwetara na Rivers Steeti. Ngwa vootu ole ka Uzodimma nyere onyeisiala na 2023," Wike jụrụ.

Wike kwuru ihe ndị a dịka Hope Uzodimma, onye bụkwa onyeisioche otu jikọrọ ndị gọvanọ APC, gụpụtara nkwekọrịta ha nwere n'otu ọgbakọ ha, na ha ga-akwado naanị ndị nọ na pati APC na ntuliaka 2023. Na ha amaghị ihe ọbụla dịka 'Rainbow Coalition'.

Nyesom Wike

N'ụbọchị 21 nke otu ọnwa Sepụtemba ahụ kwa, Wike kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ na onweghị ihe ga-eme ka ọ kwadoo Hope Uzodimma maka ọkwa Sinetọ mpaghara Imo West nke ọ na-azọ.

"Nwoke a ka nwere oge ịnọ n'ọkwa gọvanọ ruo Jenụwarị afọ 2028, mana ugbua, ọ na-achọ ịhapụ oche gọvanọ ga zọwa sineti, n'ihi na ọ na-achị ịbụ onyeisi sineti. Agaghị m akwado ụdị mmadụ dịka Hope Uzodimma ịbụ onyeisi Sineti Nigeria," Wike kwuru.

Nke a bịara dịka kepukepu na-ekwu na Uzodimma na-arọ anya iso zọọ ọkwa onyeisi sineti ma ọ bụrụ na o merie ntuliaka sineti ya na 2027.

N'ọnwa Ọkụtoba 2026

Ọ bụ n'emume mmepe achụmnta vootu nke onyeisiala Bola Tinubu, e mere n'obi gọọmentị n'Aso Rock Abuja, ka esemokwu dị n'etiti Wike na Uzodimma pụtara ihe.

Dịka Wike batara n'emume ahụ na-ekele ndị mmadụ, ka o rutere ebe Uzodimma nọ, ọ gafeere ya n'agbanyeghị na Uzodimma kwụụrụ ọtọ ma na-ewepụta aka ikele ya.

N'ime otu ọgbakọ ahụ, Wike kwuru okwu sị: "Onye ọbụla Tinubu na-enwetaghị mmeri na steeti ya, onye ahụ esokwala ndị ọzọ na-ekwu na anyị emeriela."

Ọtụtụ kwuru na ọ bụ Uzodimma ka ọ na-atufere okwu ahụ n'ihi na Tinubu nwetara ọnụọgụgụ vootu dị nta n'Imo Steeti na ntuliaka 2023.

N'ọnwa Nọvemba 2026

Dịka ụlọikpe nyechara iwu nke chụpụrụ Hope Uzodimma ma tinye Rochas Okorocha dịka onye ga-azọ ọkwa sineti mpaghara Imo West na pati APC, akụkọ malitere ifegharị na aka Nyesom Wike nwere ike ịdị na mkpebi ahụ ụlọikpe nyere.

Wike kwetara na Rochas Okorocha bụ enyi ya ma nwekwaa nkwado ya n'ọkwa ọ na-azọ, mana "abụghị m onye APC, abụghị m onye Imo Steeti, abụghị m ọkaikpe, anaghị m azọ ọkwa sineti, kedu etu m ga-esi tinye aka n'ihe ụlọikpe kpebiri?"

Nọvemba 2026

Hope Uzodimma
Nkọwa foto, Hope Uzodimma bụkwa onyeisi otu jikọrọ ndị gọvanọ pati APC

N'otutu emume ịchụnta vootu nke ndị otu Wike haziri na Rivers Steeti, Wike kwuru na ya ahazichaala etu onyeisiala Tinubu ga-esi nweta mmeri na Rivers Steeti nakwa na FCT.

O kwuru na ya ga-arịọ ndị isi APC ka ha nyefee ya Imo Steeti ka ọ hazie.

Ndị mmadụ kwuru na nke a bụ ụzọ Wike ji atụfere gọvanọ Hope Uzodimma okwu mkparị, ka a ga-asị na gọvanọ ahụ anaghị eme nke ọma ịchịkọta achụmnta vootu onyeisiala na steeti Imo.

'Wike bụ nwa odibo' - Novemba 2026

Okwu ikpeazụ Wike kwuru kpatara pati APC n'Imo Steeti ji wepụta akwụkwọ ozi ebe ha kpọrọ Wike "nwa odibo" nakwa "onye ọrụ ngo a na-akwụ ụgwọ".

N'ime akwụkwọ ozi ahụ, odeakwụkwọ mgbasaozi ndị APC Imo Steeti bụ Onwuasoanya Jones, kwuru na oge na-adịghị anya Wike ga-aghọta na ngwangwa onye ọrụngo rụchara ihe a kwụrụ ya ụgwọ maka ya, onwekwaghị uru ọzọ ọ ga-aba.

"Ọ bụrụ na Wike nwere aha dịka o si chee, ya tiwere pati ya bụ PDP mkpu, ka anyị mara ma e nwere ihe ha ga-achịta," Jones dere.