Olileanya adịrịla nde kwuru nde mmadụ dịka ọgwụ HIV dị ọnụala na-erute Africa

Lenacapavir
    • Onye dere ya, Wyclife Muia
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

-Mba Uganda adịla njikere ịnata agba nke mbụ ọgwụ mgbochi HIV dị ọnụala bụ nke olileanya bụ na ọtụtụ ndị mmadụ bi n'Africa ebe ọrịa HIV kachasị , ga-enweta ya.

Agba nke mbụ nke ọgwụ ahụ a kpọrọ, Lenacapavir, rutere mba Zambia n'ụbọchị Wednezde. dịka ụlọọrụ 'Global Fund' si kwuo.

Ọgwụ a bụ ọgwụ a na-agba ugboro abụọ n'afọ ga-ada dọla iri anọ ($40) maka otu onye n'afọ.

Lenacapavir na-arụ ọrụ site na igbochi nje HIV ịmụba ma bute ọrịa n'ahụ.

Nnwale e mere ọgwụ ahụ bụ nke e ji ụmụagbọghọ na ụmụnwaanyị na-eto eto karịrị 5000 were nwalee na mba Uganda na South Africa n'afọ 2024, o nweghị otu onye na ndị a gbara ọgwụ ahụ butere HIV.

Ndị ọkachamara ahụike kwuru na ọgwụ ọgbụgba ahụ nwere ihe o ji kaa nke mkpụrụ ọgwụ a ma dịka 'pre-exposure prophylaxis' (PrEP) mma, dịka a na-aṅụ nke ahụ kwa ụbọchị ma bụrụkwa nke na-ebute ndị mmadụ ịsọ ha asọ.

Ụlọọrụ ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organization' (WHO) tụrụ alo ọgwụ a maka mgbochi HIV na Julaị ,afọ 2025.

Ụlọọrụ 'Global Fund' kọwara mbata ọgwụ a n'Africa dịka' nnukwu ihe" n'ọgụ a na-alụ megide HIV, sị na ọnụala ọgwụ a dị ga-enye aka hụ na o rutere nde kwuru nde ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ ibutenwu HIV aka igbochi ya.

Ozi mgbasaozi ụlọọrụ ahụ wepụtara kwuru sị, "Mbụte ọgwụ a gosiri mbawanye ohere inweta ezigbo ọgwụ dị ọnụala maka igbochi HIV na mba ndị dara ogbenye."

Zimbabwe ga-enweta nke ha na mbido afọ 2027, ebe mba ndị ọzọ ga-eso ya.

Ọgwụ ọnụala a na-apụta ka ọ gachara otu afọ nke nnukwu ya nke ụlọọrụ America bụ Gilead Sciences, bịara na mpaghara ọzara Sahara Africa.

A na-ere nke nnukwu ya puku dọla iri abụọ na asatọ ($28,00) n'America nke mere ya ihe ọtụtụ nnọ na mba na-emepeghị emepe.