Jimmy Odukoya: Ihe mere ụlọikpe ji nye iwu ka a nwụchie ụkọchukwu 'Fountain of Life'

Ebe foto si, Jimmy Odukoya/Instagram
Ụlọikpe Ukwu dị na Lagos enyela iwu ka a nwụchie Jimmy Odukoya bụ ụkọchukwu na-achịkọta ụlọụka 'Fountain of Life Church' dị n'Ilupeju ,Lagos State.
Nke a na-abịa dịka Odukoya abịaghị n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọọzde dịka ọkaikpe O. O. Adewunmi-Oshin si nye n'iwu n'ụbọchị Mọnde n'ike gbasara esemokwu na ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisi n'ụlọụka ahụ ụzọ abụọ.
Ndị isi ụlọụka 'Fountain of Life', nke gunyere nwanne nwaanyi Jimmy Odukoya, bụ Tolu Odukoya, wegara mkpesa n'ụlọikpe ma kwuo ka a kwụsị Jimmy Odukoya ịrụ ọrụ dịka onyeisi ụkọchukwu ụlọụka ahụ.
Ha kwuru na nke a bụ maka onyonyo nke onye hibere ya bụlọụka bụ Taiwo Odukoya mere oge ọ dị ndụ, ebe ọ kpọpụtara aha onye ga-anọchi ya ma ya nwụọ, na-abụghị nwa ya nwoke Jimmy.
Onyonyo ahụ efesaala na soshal midia Nigeria ugbua.
N'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba a, Ọkaikpe O. O. Adewunmi-Oshin nke ụlọikpe ukwu steeti Lagos nyere iwu ka Jimmy Odukoya kwụsị igosi onwe ya dịka onyeisi ụkọchukwu ụlọụka 'Fountain of Life' ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe gbasara onye kwesịrị ịbụ onyeisi ụlọụka ahụ.
Mana n'ụbọchị ụka na-eso ya, bụ Nọvemba 22, Jimmy Odukoya dukwara ofufe n'ụlọakụ ahụ etu o si emebu, ma kwuo na ya nụrụ mana ya ahụbeghị akwụkwọ ụlọikpe ọbụla kwuru ka ya kwụsị ọrụ dịka ụkọchukwu.
N'echi ya bụ Mọnde, Nọvemba 23, ndị isi ụlọụka ahụ gaghachikwara n'ụlọikpe, ebe ọkaikpe Adewunmi-Oshin nyere ikike ka ha mapanye akwụkwọ ikpe ahụ n'ahụ ụlọ ebe Jimmy Odukoya bi, ma nyekwa ụkọchukwu ahụ iwu ka ọ bịa n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọọzde.
Mana dịka ụbọchi ikpe ahụ rukwara, Jimmy Odukoya abịaghị ụlọikpe, nke mere ọkaikpe Adewunmi-Oshin jiri nye iwu ka ndị uweojii nwụchie ya ma kpụta ya n'ụlọikpe ụbọchị ọzọ a ga-ehibe ikpe ahụ.
Etu nkewa a si malite
Esemokwu a dị n'etiti Jimmy Odukoya na nwanne ya nwaanyi Tolu nakwa ụfodụ ndị isi ụlọụka 'Fountain of Life', pụtara ihe oge ndị isi ụlọụka ahụ wepụtara akwụkwọ iji kwuo na Jimmy abụghịzị onyeisi ụlọụka ahụ.
Jimmy n'onwe ya wepụtakwara ozi kwuo na ya ka bụ onyeisi 'Fountain of Life' dịka usoro e si họpụta ya n'afọ 2023 ziri ezi.
Nke a bịara naanị ụbọchị olemole Jimmy kwupụtachara gbasara alụdinanwunye n'etiti ya na Mo Jasmine Daniel (bụzi Mo Odukoya ugbua) na soshal midia, nke butere okwu dị icheiche nakwa nkatọ n'aka ụfọdụ mmadụ.
Ụfọdụ kwuru na Jimmy alụbuola nwaanyị ma mechaa gbaa alụkwaghịm ebe Mo alụbuola di ma gbakwaa alụkwaghịm, na o zighi ezi n'iwu ndị okpukperechi Christ ịgba alụkwaghịm.
Okwu gbasara ọlụlụ di na nwunye n'etiti Jimmy na Mo Jasmine sokwa n'ihe ndị isi ụka 'Fountain of Life' kwuru na o megidere nkuzi ụka nakwa ogogo onye ndu ụka kwesịrị ịnọ na ya.
N'aka nke ya, Jimmy Odukoya wepụkwara mkpesa n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị na Legọs, megide nwanne ya nwaanyị Tolu na ụfọdụ ndị isi ụlọaka ahụ gbasara etu ha si wepụ ya n'ọkwa onyeisi ụkọchukwu.
O dobeghị anya oge ikpe nke a ga-amalite.


























