A nwụchiela Adeniyi Adeyemi maka ebubo ihiwe ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja

Ebe foto si, Presidential Foreign Intervention Promotion Council/Instagram
Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela onyeisi ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja dịka ụlọikpe nyere iwu ka a nwụchie ya.
Adeniyi Adeyemi onye kpọrọ onwe ya onyeisi ụlọọrụ Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC) abịaghị ụlọikpe nke ugboro abụọ n'ụbọchị Tuzde 14 Julaị, 2026, ọ bụ nke a mere ka Ọkaikpe Moahammed Umar nke Ụlọikpe Ukwu Etiti Naịjirịa dị n'Abuja ji nye iwu ka a nwụchie Adeyemi ebe ọbụla ọ nọ.
Ọ bụ nke a mere ndị ọrụ nchekwa ji kapara ngwangwa ụlọikpe nyere iwu ahụ.
Cheta na gọọmenti boro Adeniyi Adeyemi ebubo ihiwe ụlọọrụ gọọmenti adịgborja a kpọrọ Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC).
Obi ọchịchị Naịjirịa kwuru hoo ha na ụlọọrụ ahụ bụ ụlọọrụ adịgboroja ma kọwaa na enweghị oge ọbụla Onyeisiala Bola Tinubu ji nye Adeyemi ọkwa ọbụla.
Ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchie Adeniyi Adeyemi

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Ụlọikpe Ukwu Etiti Naịjirịa dị n'Abuja enyela iwu ka a nwụchie Adeniyi Adeyemi maka na ọ bịaghị n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde 14 Julaị 2026 maka ebubo asatọ gụnyere nrụrụaka na ndị ọzọ e boro ya.
Ọkaikpe Mohammed Umar kpebiri nke a oge a kpọlitere ikpe Adeyemi n'ụlọikpe ma chọpụta na ọ bịaghị ụlọikpe.
Cheta na ndị uweojii kpụpụrụ Adeniyi Adeyemi onye e boro ebubo ihiwe ụlọọrụ gọọmenti adịgborja a kpọrọ Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC), na mmadụ abụọ ọzọ n'ụlọikpe maka ebubo gụnyere nrụrụaka nakwa iji akwụkwọ gọọmenti adịgboroja hiwe ụlọọrụ gọọmenti
Pati ndị anọghị na gọọmentị agbarụọla ihu dịka Tinubu nyere ICPC iwu ka ha nyochaa PFIPC

Ebe foto si, Adeniyi Adeyemi
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba gọọmenti ukwu ajụla atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu nyere ka 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission' (ICPC) nyochaa ebubo metụtara ụlọọrụ a sị na ọ bụ nke adịgboroja a a kpọrọ, 'Presidential Foreign Intervention Promotion Council' (PFIPC).
Nkatọ a sochiri ntuziaka nke Tinubu nyere ICPC ka ha nyochaa ọrụ PFIPC, nke Adeniyi Adeyemi na-edu, ma nyefee mputara ya n'ime ụbọchị iri atọ.
Dịka ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga, binyere aka si kwuo,nnyocha ahụ ga-elekwasị anya n'ebubo imepụta akwụkwọ adịgboroja, mgbalị ịchọ, akpaego ụlọakụ, azụmahịa ego na ndịọrụ gọọmenti maọbụ ndị ọzọ sonyere.
Ihe pati ndị na anghị n'ọchịchị na-ekwu

Ebe foto si, Omoleye Sowere/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mana Ọnụ na-ekwuru African Democratic Congress (ADC) bụ Bolaji Abdullahi, na onye ndọrọndọrọ ọchịchị Omoyele Sowore nke Africa Action Congress (AAC) kwuru na gọọmenti etiti agaghị enwe ike ime nyocha n'ụzọ ziri ezi n'ihe metụtara ebubo e boro ya.
N'ozi o weputara na ụbọchi Wenezde, Bolaji kwuru na ụlọọrụ Onyeisiala eburula ụzọ kpee ikpe site n'ịkọwa akwụkwọ ndị metụtara okwu ahụ dịka akwụkwọ adịgboroja tupu nyocha amalite.
N'otu aka ahụ, Sowore sikwa na onweghi ntụkwasị obi ebe nyocha ICPC nọ.
Ha abụọ kwuru na naanị kọmitii nọọrọ onwe ha nwere ike ịchọpụta eziokwu ma weghachite ntụkwasị obi ọha.
Ọgbaghara ahụ gbadoro ụkwụ na nkwupụta Adeyemi na-ekwu na a họpụtara ya n'ụzọ iwu kwadoro dịka Onyeisi PFIPC.
Ọ boro Onyeisi ndịọrụ Onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila, ebubo iri ngari n'ihi nhọpụta ahụ, ma jụkwa nkwupụta gọọmenti na ụlọọrụ PFIPC adịghị.
Ma ụlọọrụ Onyeisiala kọwara Adeyemi dịka onye aghụghọ, na-ekwu na o mepụtara akwụkwọ nhọpụta adịgboroja jiri ya kpọọ onye ọrụ gọọmenti n'ụlọọrụ na-adịghị adị.
Ka ọ dị ugbu a, e boro Adeyemi na mmadụ abụọ ọzọ ebubo mpụ asatọ n'ụlọikpe, ebe a ga-amalite ikpe ahụ na 27 Julaị.
Cheta n'otu pati Nigeria Democratic Congress, NDC kpọrọ oku ka a chụpụ Gbajabiamila ozugbo, maka ebubo gbasara ya na ụlọọrụ gọọmentị a na-enyo enyo nakwa okwu ịre ọkwa ọrụ gọọmentị.
N'ozi ọnụ na-ekwuru NDC bụ Osa Director wepụtara na Fraịde, abalị atọ nke ọnwa Julaị, otu pati ahụ rịọrọ Onyeisiala Tinubu ka ọ kwụsị Onyeisi Ndị Ọrụ ya n'ọrụ nwa oge, iji nye ohere maka nnyocha doro anya n'ihu n'ebubo ndị ahụ.






























