Adeniyi Adeyemi o hiwere ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja?
Obi ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ọ ga-akpụpụ Adeniyi Adeyemi Matthew onye kwuru na ya bụ onyeisi ụlọọrụ gọọmentị adịgboroja a kpọrọ,'Presidential Foreign Intervention Promotion Council' n'ụlọikpe na Julaị 27, 2026..
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na ụlọọrụ ahụ a kpọrọ 'adịgboroja' nke dị n'ogige 'Federal Secretariat Complex ' Phase 111, Abuja. nwere nketa na bọjet Naịjirịa nke afọ 2026.
Bayo Onanuga bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Bola Tinubu kwuru n'ozi o wepụtara n'akara X ya, Kpọrọ oku ka onye ọbụla dere duu ma chere mpụtara ya bụ ikpe.
Ọnanuga, onye kọwara Adeyemi dịka 'onye na-eme chandum, kwuru na akụkọ nwamadi ahụ pụtara ihe oge mkpesa banyere ụlọọrụ adịgboroja ahụ sị ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche gụnyere; ụlọọrụ 'Nigerian Investment Promotion Council' na Ministrị na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ọzọ.
Onanuga kwuru na ọ bụ mkpesa ndị ahụ kpalitere onyeisi ọrụ onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila ji degara ụlọọrụ DSS na ndị uweojii akwụkwọ ma kpoo oku ka ha mee nnyocha banyere ụlọọrụ adigboroja ahụ na-ekesa akwụkwọ ozi ọrụ adigboroja si n'ụlọọrụ onyeisi ọrụ Onyeisiala.
O kwuru hoo haa na enweghị oge ọbụla Onyeisiala Tinubu ji hiwe ụlọọrụ ahụ ma kwuo na Adeniyi emeela mpụ dị iche iche nke megidere iwu ma metọọ aha ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Ndị uweojii nwụchiri Adeniyi Adeyemi n'ụbọchị Mọnde 27 Ọktoba, 2025. E nwetere ọtụtụ ihe akaebe n'ụlọọrụ ya nakwa n'ụlọ obibi ya dị na Suleja.
Adeniyi Adeyemi gwara ndị uweojii na ọ bụ nwaamadị aha ya bụ Dolapo Babatunde Tanimola nyeere ya aka nweta akwụkwọ ọrụ a sị si ụlọọrụ onyeisi ọrụ onyeisiala.
Ndị uweojii mere nnyocha ma chọpụta na ọkụ gbagburu Tanimola n'ụlọoriri na ọṅụṅụ Kachi Hotel dị n'Abuja n'ụbọchị Wenezde 22 Ọktoba, 2025. Ndị uweojii kwuru na ha hụrụ ozu ya n'ọbaozu.
Nnyocha ndị uweojii mere chọpụtara ọtụtụ ihe akaebe ma kwuo na Adeniyi Adeyemi nwere akara ụlọakụ dị 34 ma kwuo na o ji akwụkwọ adịgboroja nweta akara n'Ụlọakụ Etiti Naịjirịa (CBN).
Mana nchọpụta anyị mere gosiri na gọọmenti Naịjirịa mapụtara ego maka 'Presidential Economic Advisory Council na bọjetị afọ 2026.
Mana ozi Adeyemi wepụtara n'ụbọchị Fraịde 26 Juun, 2026, gọnarịrị ebubo ndị ahụ Onanuga na Gbajabiamịla na-ebo ya ma kwuo na o ji akwụkwọ akaebe gosiri na Onyeisiala Tinubu bụ onye họpụtara.
O kwuru na ụlọọrụ Presidential Foreign Intervention Promotion Council nke ọ bụ onyeisi ya n were akara n'ụlọakụ etiti Naịjirịa ma kwuo na gọọmenti mapụtaara ha ego na bọjet afọ 2026.
Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka Onyeisiala Tinubu hiwe ụlọọrụ ga-eme nnyocha zuruoke banyere ebubo ahụ Gbajabamila na-ebo ya iji mara onye na-ekwu okwu.



