Odogwu Asaba: Ka o si gaa n'ụloikpe ebubo ndina n'ike na ịkpata ọnwụ Favour Agbro

Ebe foto si, Odogwu Asaba/ Favour Agbro/Facebook
Ifeanyi Ogbonna, onye ọtụtụ mmadụ maara dịka "Odogwu Asaba", agọọla aka ya na ụkwụ ya n'ebubo ndina n'ike na igbu mmadụ e boro ya n'ihe metụtara ọnwụ nwata nwaagbọghọ aha ya bụ Favour Agbro.
Ogbonna gọnarịrị mpụ ndị ahụ mgbe a kpụpụtara ya n'Ụlọikpe UkwU nke Delta state, n'ụbọchị Wenezde, abalị 21 n'ọnwa Ọktoba, 2026, dịka a gụpụta ebubo e boro ya.
Cheta na akụkọ fegharịrị na soshal midia ọnwa ole na ole gara aga boro ebubo na Odogwu Asaba dinara Favour n'ike oge nwata nwaanyị ahụ si Warri gaa Asaba izute ya.
Dịka ozi ụlọọrụ ndị ọkaiwu na-anọchite anya Ogbonna bụ Triple O & C Chambers si depụtara n'akara Facebook ha si kwuo, onye nnukwu Ọkaiwu Gọọmentị Delta bụ Omamuzo Erebe, rịọrọ ụlọikpe ka o nye ha oge ọzọ iji tinye akwụkwọ nkwupụta ndị akaebe asaa ha chọrọ ịkpọ n'ikpe ahụ.
Ụlọikpe nyere ndị ọkaiwu gọọmentị ụbọchị asaa ka ha tinye akwụkwọ ndị ahụ, wee higharịa ikpe ahụ ruo abalị 28 n'ọnwa Ọktoba 2026.

Ebe foto si, Screengrab
N'akwụkwọ ozi ọzọ, ọkaiwu pụtara n'ụlọikpe n'aha ezinaụlọ Favour bụ Awele Ideal, kwurụ na ọ dị mkpa ka ikpe ahụ gaa n'ihu n'ụzọ ziri ezi na enweghị ajọ mbunobi megide onye ọbụla.
O kwuru na onye ọbụla na-enweghị afọ ojuju n'ikpe ụlọikpe ga-ekpe n'ikpeazụ nwere ikike ịrịọ Ụlọikpe Mkpegharị ka o nyochaa ya, dịka iwu siri dị.
A ka ga-ekpebi ebubo eboro Ogbonna n'ụlọikpe, ebe ọ bụ na ọ jụla ebubo ndị ahụ.
A na-atụ anya na ikpe ahụ ga-aga n'ihu n'abalị 28 n'ọnwa Ọktoba.






























