Gregory Ikechukwu Ibe nwe mahadum 'Gregory University', alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 63

Ọkammụta Gregory Ibe
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye nwee mahadum 'Gregory University' dị n' Uturu,Abịa state bụ Prof. Gregory Ikechukwu Ibe a laala mmụọ ka ọ gbachara afọ 63.

Ọ bụ otu n'ime ụlọọrụ o hiwere bụ Skill G' mara ọkwa ọnwụ ya n'ozi ha wepụtrara na ụbọchị Monday n'ọbaozi Facebook.

Ozi ahụ kwuru sị, "Anyị ji obi mwute ekwupụta ọnwụ onye hibere ụlọrụ anyị bụ Prof. Gregory Ikechukwu Ibe."

Ihe ndị ị maghị maka Gregory Ikechukwu Ibe

Ọkammụta Gregory Ikechukwu Ibe bụ ojiegoachụ ego banyere na agụmakwụkwọ.

Ogogwu ahụ bụkwa onye ndọrọ ndọọ ọchịchị azọbuola ọkwa Gọvanọ Abia state n'aha otu APGA n'afọ 2023.

Mana ihe e jikarịrị mara ogogwu ahụ bụ ihiwe mahadum 'Gregory University' dị n'Uturu, Abia state.

Ọ bụ ya nwekwa ụlọọrụ teknụzụ a kpọrọ 'Skill G' nke dị n'Abuja.

Onye Abia State mana a mụrụ ya na Kaduna.

Ọ hapụrụ ụmụ isii na ụmụụmụ were laa mmụọ.