Kedụ otu bụ De Norsemen Kclub eboro ebubo idozi ụlọọrụ ndị uweojii na Rivers state?

Foto njimara ndí uweojii na njirimara De Norsemen
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu De Norsemen Kclub ngabala River state, akatọọla akụkọ na-efegharị ma kwuo na akụkọ ahụ na-emetọ aha ha.

Cheta na ọtụtụ akụkọ malitere ifegharị banyere ndozi ụlọọrụ ndị uweojii nke akụkọ kwuru na ọ bụ otu a gara dozie ụlọọrụ ndị uweojii dị na Trans-Amadi-Abuloma dị na Port Harcourt isiobodo River state iji merube emume ụbọchị enyemaka ha na-eme kwa afọ.

Dịka ha mere nke a, ọtụtụ mmadụ malitere ịkatọ ha ma kwuo na o doghị anya ihe bụ ebumnobi otu ha nke mere ha jiri gaa dozie ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.

Ọ bụ nke a mere ka isi ụlọọrụ ndị uweojii na Rivers state kwụsị onyeisi ndị uweojii (DPO) nke Abuloma Police Outpost nakwa ụfọdụ ndị uweojii na-arụ ọrụ n'ogige ndị uweojii ahụ ọrụ dịka ha gbarụrụ ihu maka ebubo na ha nyere ohere ka ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo rụgharị ogige ndị uweojii ahụ.

N'ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers state bụ Agabe Blessing Kaborlo kwuru na ha nwetara ozi banyere akụkọ nakwa ihe onyonyo na-efegharị n'ịntanetị banyere ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuloma Police Outpost a sị ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo rụzigharịrị.

Gịnị ka ndị otu ahụ kwuru?

Mana ozi otu De Norsemen wepụtara, mere ka o doo anya na ha anabataghị mmetọ nakwa ụdịrị echiche ọjọọ ndị mmadụ nwere maka ha n'ihi ọrụ ha rụrụ iji merube emume ha na-eme kwa afọ.

Ozi ahụ kwuru na ha anaghị eme emume enyemaka iji nweta uru ọbụla n'aka gọọmenti kama na ọ bụ maka nkwenye ha n'inyere mmadụ ibe ha aka n'ụzọ ọbụla ha nwereike ma nyere aka kwalite ọdịmma obodo.

Akwụkwọ ozi ahụ gara n'ihu kwuo na otu ha ga-aga n'ihu na-akwado nkwalite obodo ma kpọọ oku ka ndị nkwado ha n'ebe dị iche iche ghara ige ntị nye akụkọ ọbụla na-achọ imetọ aha otu ha na-akwa mbọ ha na-agba n'obodo.

Kedụ otu bụ De Norsemen Kclub?

De Norsemen Kclub bụ otu e guzobere n'afọ 1983 na Mahadum University of Port Harcourt, dị na Rivers state, Nigeria.

Ọ bụ otu e guzobere dịka otu na-abụghị nke gọọmentị nwee, ma bụrụkwa nke lekwasịrị anya n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na omenala.

Ndị otu ahụ na-eji ihe nnọchianya ndị 'Norse na Viking' nke gụnyere ụgbọmmiri ndị Viking, ọta, na Odin), ma na-ahazi ndị otu ya site n'iji aha ndị metụtara ọrụ ụgbọmmiri, dịka onye ọrụ ụgbọmmiri, onyeisi ụgbọmmiri, na onye ndu.

Nchọpụta BBC gosiri na onye chọrọ ịbụ onye otu ahụ ga-abụ onye gụsịrị akwụkwọ na ndị ọkachamara nwere akara ugo mmụta mahadum, HND, ma ọ bụ ihe ha na ya so.

Ndị otu ahụ kwukwara na ha na-akwalite ọrụ ebere, mkpali ọbara, ọrụ ahụike, agụmakwụkwọ, na mmepe obodo (dịka ọrụ mgbasa ozi obodo na ọrụ ọha).

N'agbanyeghị, ndị mmanye iwu, ụlọọrụ nchekwa, na ụlọikpe dị iche iche na steeti Nigeria na-ekewa ma na-ekpe otu ahụ ma ọ bụ ndị otu ya ikpe dịka otu nzuzo iwu na-akwadoghị nke jikọtara ya na ime ihe ike na esemokwu otu ndị iro.