Simon Ekpa: Ụlọikpe ebelatala oge e nyere ya ịnọ n'ụlọmkpọrọ

Simon Ekpa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Mkpegharị nke mba Finland ebelatala afọ ole e nyere Simon Ekpa ị nọ na mkpọrọ maka ikpe a mara ya n'ebubo iyi ọha egwu site n'afọ isii gbatuo afọ anọ, dịka ụlọ ntaakụkọ mba ahụ si kwuo.

Cheta na n'afọ 2025, Ụlọikpe Päijät-Häme dị na mba Finland tụrụ nwafọ Naịjirịa bụ Simon Ekpa nga afọ isii maka ime mpụ iyi ọha egwu na ịkpalite mpụ iyi ọha egwu.

Ụlọikpe gbadoro ụkwụ 'ihe Ekpa jị ọbaozi ya na soshal midia akwanye mmanụ n'ọkụ n'ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ nke Nigeria n'agbata afọ 2021na 2024 wee maa ya ikpe.

Ekpa gọrọ agụgọ ebubo ndị e boro ya ma gbagharịa akwụkwọ iji maa mkpebi ụlọikpe ahụ aka.

Simon Ekpa dịka ọ na-eletu anya n'ala

Ụlọikpe Mkpagharị makwara Ekpa ikpe ọzọ mana ha gbubilatara oge e nyere ya ịnọ na mkpọrọ dịka akwụkwọ akụkọ mba Finland si kwuo.

Akụkọ ka na-abịa