Ihe ị kwesịrị ma maka Kenneth Okonkwo Atiku họpụtara dịka ọnụ na-ekwuru ya

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/X
Onye ji aha pati African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027 bụ Atiku Abubakar ahọpụtala onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Kenneth Okonkwo dịka ọnụ na-ekwuru ya.
Kenneth Okonkwo gbara ama ozi a n'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya.
N'ozi ahụ o wepụtara, Kenneth Okonkwo, Atiku Abubakara maka nnukwu ntụkwasịobi o nwere n'ebe nọ ma kwuo na nhọpụta ahụ gosiri na Atiku bụ onye kwenyere n'ọchịchị onyekwuouche ya.
Onye bụ Kenneth Okonkwo?

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/Instagram
Kenneth Okonkwo, bụ onye na-eme ejije Nollywood a ma ama ma bụrụ onye ọkaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Kenneth Okonkwo bụ onye okpuru ọchịchị Nsukka dị n' Enugwu steeti, a mụrụ ya n'afọ 1968. Aha nne na nna ya bụ Beatrice Okonkwo na Ozioko Francis Okonkwo.
Ọ gụrụ 'Business Administration' na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'
Dịka onye na-eme ihe ejije, Okonkwo pụtara ihe oge o so mee ejije Nollywood, a kpọrọ 'Living in Bondage' bụ ebe ọ zara 'Andy Okeke', nwoke banyere n'otu nzuzo iji nweta ego.
Ihe Onyonyo ndị ọzọ o mere gụnyere: Kingdom of Men, Ọganigwe, Heart of a widow, Wives on Strike nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
O ritela ọtụtụ nzeere na onyinye maka ọrụ ya dịka onye ejije nke gụnyere Pillars of Nollywood n'afọ 2013 site n'aka 'Africa Movie Academy Award (AMAA).
Okonkwo mechara laghachi mahadum gụọ maka Iwu ma malitekwa ọrụ dịka onye ọkaiwu.

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/Instagram
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
O banyere ndọrọndọrọ ọchịchị n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP) mana o mechara hapụ PDP banye na pati APC ebe o kwụpụtara ebumnọbị ya ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019, mana o merighị na ntuliaka imeụlọ pati ahụ.
N'afọ 2022 , Kenneth Okonkwo hapụrụ APC banye pati Labour Party ma soro na ndị na-ekwuru pati ahụ n'oge ntuliaka afọ 2023.
N'afọ 2025, Okonkwo kwuru ya gbaala arụkwaghịm na pati Labour party ma malite ikwu na ọ kwadoro ka onye si mpaghara ugwu Naịjirịa bụrụ onyeisiala na ntuliaka afọ 2027.
Na nsonso a, ọ malitere ikwu okwu megide onye ga-eji aha pati Nigeria Democratic Congress (NDC) bụ Peter Obi n'ụfọdụ ajụjụọnụ ụlọmgbasaozi ụfọdụ jụrụ banyere ọnọdụ ọchịchị na Naịjirịa nakwa ntuliaka afọ 2027.
Kenneth Okonkwo nwere ezinaụlọ. Aha nwunye ya bụ Ifeoma, ha mụtara otu nwa.
Mana nke na-abịa dịka nwaanyị mbụ ọ lụrụ bụ Ogechi Ezekiel, nwa onyeisi ụka , Christian Pentecostal Mission International (CPM) bụ Pastọ Ezekiel gbasara ka ha lụrụ alụmdi na nwunye n'afọ 2000 mana alụmdi na nwunye ha ahụ kụrụ isi n'aja. Ha mụtara otu nwa na alụmdi na nwunye ahụ.





























