Pete Edochie nna m nwere ihe ọ kuziri anyị agaghị echefu - Leo Edochie

Ebe foto si, Leo Edochie / Facebook
Leo Edochie bụ nwa nke mbụ onye na-eme ejije a maama aha ya bụ Pete Edochie nwụrụ abalị ole ma ole garaaga akọwaara BBC ọtụtụ ihe ha agaghị echezọ nna ha.
Leo Edochie bụ onye na-eri uju maka ọnwụ nna ya gwara BBC ọtụtụ ihe nna ya kuziri ha n'oge ha dị na nwatakịrị.
Leo kọwara nna ya dịka onye na-agbaziri mmadụ ma bụrụkwa onye nwere ugwu.
N'okwu ya "Oge ọ nọ n'ọrịa, ana m abịa ahụ ya kwa izuụka ọbụla. Ọ na-agwa m na ike na-agwụ ya, na ya enweghị mmasị iri nri".
"Ana m abịa hụ ya ma laghachi. Ahụrụ m ya ọfụma, soro nọrọ ma kpaa nkataa, mara ihe ndi dokịta na-ekwu ya onwe ya amarakwa ihe ndị dọkịta na-ekwu tupu Chineke nọ n'eluigwe sị ngwa, Odogwu lọtaba".
"Ahụrụ m papa m n'anya nke ukwuu. Papa m bụ onye na-elegara anya. Papa m bụ onye m chọrọ ka m dị ka ya".
"Ihe ndị ụwa niile na-ahụ dị iche n'ihe anyị onwe anyị na-ahụ. Mụ onwe m na-ahụ onye gosiri m ụzọ. Onye mụtara m".
"Onye zụrụ m, zụọ m n'ụlọakwụkwọ, zụọ m n'ụwa. Kụziere m ka ụwa dị. Kụziere m ka e si ebi ndụ. Kụziere ihe bụ na nwoke kwuo okwu, ya bụrụ nwoke. Ọ bụrụ na a kpọọ gị jụọ gị kedụ ihe mere, kwuo ka o si mee. Ya bụrụ eziokwu".

Ebe foto si, Leo Edochie / Facebook
"Mana amaara m na ọ bụ Odogwu maka na ị pụọ n'èzí, ị ga-anụ ihe ndị mmadụ na-ekwu. Ooo nna gị bụ ihe a, nna gị bụ ihe nke ọzọ. Amaara m. Mana nke mbụ bụ na ọ bụ nna m ka ọ bụ. Odogwu ka ọ bụ".
"Onye ezigbo omume. Onye na-akụzi ezi omume. O tie gị ihe oge anyị dị na nwatakịrị, ọ ga-ahapụ ka ị kwaa akwa, ọ kpọọ gị ka gị na ya nọrọ ala, ọ kọwaara gị ihe mere o ji tie gị ihe".
"Ọ bụ ụdị mmadụ ọ bụ. Mana ka anyị na-eto, ka anyị dị ntakịrị, otu ihe m ga-echeta m enweghịike ichefu bụ na ọ ga na-agwa gị, 'ihe ọbụla ọ sọrọ ya bụrụ, gwa ya eziokwu'."
"O nwee ihe ọbụla mere, ọ kpọọ gị, ị gwa ya eziokwu, onye gị ndụmọdụ. Mana ị sịara ya asị, ọ pịa gị ịtarị. Etu a ka o si zụọ anyị niile".
"Ọ zụrụ anyị n'eziokwu na ịkpa ezi àgwà mere anyị ji bụrụ mmadụ taa. Ọ bụ onye ihe na-emetụta nke ukwuu".
"Ọ naghị ahapụ onye ọbụla nwere nsogbu gbakwutere ya. Ọ bụ ụdịrị mmadụ ọ bụ".
































