E gburu otu n'ime ndị nkuzi a tọrọ n'ụlọakwụkwọ - Gọvanọ Oyo steeti

Akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara na-ekwu na a tọọrọ opekatampe, ụmụaka ruru iri anọ na ise na ndị nkuzi site na ụlọakwụkwọ atọ dị iche iche.

Ebe foto si, Gov. Seyi Makinde

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aka na-achị Oyo steeti ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu egbola otu n'ime ndị nkuzi asaa a tọọrọ na steeti ahụ.

Seyi Makinde kwuru na a tọọrọ ndị nkuzi asaa n'ụlọakwụkwọ atọ dị na okpuruọchịchị Oriire n'ụbọchị Fraịde gara aga.

O kwuru na e gburu onye nkuzi nke e kwuru na ọ bụ mgbakọ na mwepụ ka ọ na-akụzi.

Ka ọ dị ugbu a, ndị uweojii na ndị ọchịchị steeti kwuru na ha ka na-agbalị ịchọpụta kpọmkwem ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na-efu efu.

Mana akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara na-ekwu na a tọọrọ opekatampe, ụmụaka ruru iri anọ na ise.

Gọvanọ kwuru na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa na-azaghachi ndị ahụ na-eyi ọha egwu mgbe ha na-eme mwakpo ahụ merụkwara ahụ.

"Ndịagha, ndị dinta na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ merụrụ ahụ na-agbake nke ọma," ka o kwuru.

Makinde kwuru na steeti ya guzobere ihe ọ kpọrọ "otu nzaghachi mpụ ime ihe ike" na mmekọrịta ya na ndị uweojii.

Cheta na ọ bụ ụbọchị Sọnde 17 Mee 2026, ka onyonyoo na-efegharị n'ịntanetị gosiri ụmụnwaanyị na-ekwu na ha so n'ime ndị a tọọrọ ma na-arịọ maka enyemaka.

Mana ndị uweojii kwuru na ha na-enyocha eziokwu dị n'ihe nkiri ahụ ma dọọ ọhanaeze aka na ntị ka ha ghara ikesa ozi a na-emeghị enyocha nke nwere ike ime ka ụjọ jide ndị mmadụ.

Ọzọ, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, e mechiri ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ndị ihe ọjọọ metụtara na mbụ, mana gọọmenti steeti ahụ mechara nye iwu ka ha mepee ụlọakwụkọ ndị ahụ n'ụbọchị Mọnde mgbe e tinyere ndị ọrụ nchekwa ọzọ.

Ndị nchekwa amalitela ịchọ ụmụaka 50 ndị ojiegbe tọọrọ na Mussa, Borno steeti

Ndị ọchịchị Borno steeti ezigala ndị nche obodo na ndị nchekwa iji chọta ụmụaka ruru ihe dịka iri ise nke ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ dị na Mussa.