Ihe Ụlọnnọchiteanya Amerịka gwara ụmụafọ ha bi na Mali dịka e mere mwakpo n'ogige ndịagha

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Mali adọọla ụmụafọ ha aka na ntị ka ha "chọta ebe ha ga-ezere isi onwe ha.
Ndụmọdụ a na-abịa dịka e nwetara akụkọ maka ihe mgbawa nakwa ịkwa mgbọ na mba Mali.
Ozi ahụ kwuru na a nụrụ ụda ihe ndị ahụ n'akụkụ Kati na ọdọụgbọelu Modibo Keita International Airport dị n'isi obodo mba ahụ bụ Bamako.
Ụlọnnọchiteanya ahụ nyekwara ndụmọdụ ka ndị mmadụ zeghara "ime njem na mpaghara ahụ ruo mgbe e mere ka ozi ndị ọzọ ruo ha aka."
Onyeisi ihe omume Sahel Programme n'ụlọọrụ Konrad Adenauer Foundation dị na mba Mali bụ Ulf Laessing gwara BBC na ọnọdụ ahụ yiri "mwakpo ndị jihad kachasị hazie na Mali kemgbe ọtụtụ afọ."
Ndịagha mba Mali ekwuola na ha na-alụ ọgụ megide "otu ndị na-eyi ndụ egwu" a na-amaghị ndị ha bụ, mana ozi dum gbasara ya bụ nke na-edoghị anya.
Ọnụ na-ekwuchitere otu Azawad Liberation Front (FLA) bụ Mohamed Elmaouloud Ramadane kwuru na soshal midịa na ndịagha ha akpachiela ụfọdụ mpaghara Kidal na Gao.
Ọ gbakwara mba Bọkịna Faso na Nijie Rịpọblik ume ka ha ghara ịgbata ọsọ enyemaka. Ka ọ dị, BBC enwebeghị ike nyochaa ma okwu ndị a ha bụ eziokwu.
Na nso nso a ka Mali, Nijie Rịpọblik na Bọkịna Faso wepụrụ onwe ha n'otu jikọtara mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Ecowas iji hiwe otu nke ha a kpọrọ Alliance of Sahel States.
Ka ọ dị ugbua, ọ bụ ndịagha na-achị mba atọ ndị ahụ, dịka a kwatuchara ọchịchị ugboro ugboro na mba ha.
Mwakpo n'ogige ndịagha: Etu ọnọdụ dị ugbua na mba Mali

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha mba Mali ekwuola na "otu ndị na-eyi ndụ egwu" a na-amatabeghị ndị ha bụ a kwaala mgbọ "n'ụfọdụ ebe dị iche iche nakwa n'ogige ndịagha" dị n'isi obodo mba ahụ bụ Bamako, tinyekwara akụkụ mba ahụ ndị ọzọ.
N'ozi ha wepụtara n'ụtụtụ Satọde 25 Eprel 2026, ndịagha sịrị na "ọgụ na-aga n'ihu" ma gbakwunye na "ndị nchekwa anyị na ndị ọrụ nchekwa na-eguzogide ndị ahụ na-eme mwakpo ka ọ dị ugbua."
Ndị ọchịchị agbaala mmadụ niile bi na mba Mali ume ka ha dere duu ma mụrụ anya.
Otu onye bi na mba ahụ si Itiopịa na-alaghachi Bamako gwara BBC na a kagburu njem ụgbọelu niile chọrọ ịbanye n'obodo ahụ n'ụtụtụ Satọde 25 Eprel.
O dobeghị anya ma mwakpo ahụ a na-ekwu okwu ya o metụtara ọdọụgbọelu.

Ebe foto si, Getty Images
A nụkwara akụkọ gbasara ihe gbawara n'akụkụ ogige ndịagha dị na Kati n'ụtụtụ Satọde, tinyekwara ụda egbe.
Ndị bi n'obodo gwara ụlọmgbasaozi Reuters na e zipụrụ ndịagha gburugburu akụkụ obodo ahụ, dịka e mechikwara ụzọ niile banyere mpaghara ahụ.
Otu onye bi n'isi obodo Mali gwara BBC sị "anyị tetara ụra ma hụ mwakpo ndị e mere n'otu oge, tinyere abụọ na Bamako."
A chọpụtabeghị ndị aka ha dị na mwakpo ndị ahụ a na-ekwu okwu ya.
Ndịagha okpukperechi a maara dịka jihad, mekpara mba Mali ahụ ihe karịrị afọ iri.
N'afọ 2021, ndịagha kpachiri ọchịchị ma kwee nkwa na ha ga-eweghachi nchekwa ma memilaa ndịagha nnupuisi.
Gọọmenti Mali, nke Assimi Goïta nọ n'isi ya gbanwere ndị ha na mba ahụ na-emekọrịta n'ihe gbasara nchekwa, dịka ọ kwụsịrị mmekọrịta ha na mba ndị Ọdịda Anyanwụ, ma gakwuru mba Rọshịa maka enyemaka.




























