Nigeria na-atụle iwepụta iwu ga-ewepụ ntaramahụhụ maka mmadụ gbara mbọ igbu onwe ya

Ebe foto si, Getty Images/Nigeria Senate/Facebook
Ụlọomeiwu Nigeria amalitela ịtụle akwụkwọ iwu ọhụrụ ga-ewepụ ntaramahụhụ maka mmadụ ịgba mbọ igbu onwe ya.
Atụmatụ iwepụta iwu ọhụrụ a akpalitela arụmụka siri ike n'etiti ndị omeiwu banyere ma mba Nigeria e kwesịrị ịta ndị gbanarịrị mbọ igbu onwe ha ahụhụ maọbụ lekọta ha, ya na ịchọpụta ihe kpatara ụfọdụ ndị Nigeria ji achọ igbu onwe ha.
Iwu ọhụrụ a, nke onye omweiwu bụ Sinetọ Asuquo Ekpenyong nke Cross River steeti kwadoro, pụtara n'ihu ndị omeiwu Sineti Nigeria mgbe a gụpụtachara ya nke ugboro abụọ n'ụbọchị Tuzde13 Ọktoba 2026.
Dịka iwu ọhụrụ a siri kwuo, e nwereike ịta ndị nwara igbu onwe ha ahụhụ site n'ịtụ ha mkpọrọ, maọbụ iji usoro ndị ọzọ lekwasịrị anya n'inyocha, iziga ha ka ha nweta enyemaka ndị ọkachamara, ịgwọ ha, na ilekọta ndị gbanarịrị mbọ igbu onwe ha anya.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Mana ndị sinetọ, gụnyere Onyeisioche Sineti bụ Godswill Akpabio, kwenyere na iji mkpọrọ yie ndị na-egbu onwe ha egwu egbochi ma mee ka ndị mmadụ nkwụsị ịnwa igbu onwe ha.
"Ọ bụrụ na ị nwaa igbu onwe gị, hụ na ị nwụrụ n'ezie. A ga-atụ mkpọrọ onye ọ bụla nwara ime ya ma gbanarịrị ọnwụ mkpọrọ," ka Akpabio kwuru n'oge arụmụka siri ike n'Ụlọ omeiwu gbasara iwu a.
Esemokwu a na-egosi nnukwu nkewa dị n'obodo ahụ n'etiti ịta ndị nwara igbu onwe ha ahụhụ na ilekọta ha ma ọ bụrụ na ha gbanarịrị ọnwụ mgbe ha mechara mgbalị ahụ.
Gịnị ka iwu kwuru maka mmadụ igbu onwe ya?
Dịka nkebi nke 327 nke Iwu Mpụ (Criminal Code) na nkebi 231 nke Iwu Ntaramahụhụ (Penal Code) si kwuo, mbọ igbu mmadụ igbu onwe ya bụ mpụ.
Na mpaghara ndịda Nigeria, nkebi nke 327 nke Iwu Mpụ (Criminal Code) kwuru na "Onye ọ bụla nwara igbu onwe ya emela mmejọ, ya na mkpọrọ otu afọ."
Ebe nkebi 231 nke Iwu Ntaramahụhụ (Penal Code) nke na-arụ ọrụ na mpaghara ugwu Nigeria kwuru na "onye ọ bụla nwara igbu onwe ya, ga-enweta ntaramaahụhụ site n'ịtụ ya mkpọrọ ruo otu afọ, ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ ntaramahụhụ ego, ma ọ bụ ha abụọ".
Kedụ ihe iwu ọhụrụ a ga-eme?
Sinetọ Ekpenyong kwuru na Iwu Ahụike Uche Mba bụ National Mental Health Act n'olu bekee na-enye ndụmọdụ ka achịkwa ọnọdụ mmadụ mgbalị igbu onwe dịka usoro enyemaka nsogbu n'okpuru iwu ahụike uche.
"Iwu anyị na-ekwu okwu n'olu abụọ ugbu a," ka Ekpenyong kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ezie na iwu ọhụrụ ahụ ga-akwụsị nke ahụ site n'ịhapụ mpụ igbu onwe, ọ na-elekwasịkwa anya n'itinye aka n'ihe gbasara nsogbu nwereike ịkpalite nke ahụ, gụnyere ndị enyemaka, agụmakwụkwọ, ọzụzụ maka ndị uweojii, ndị nkuzi na ndị ọrụ ahụike, na usoro nlekota mgbochi igbu onwe.
Sinetọ Ekpenyong bụ onye nkwado iwu ahụ kwuru na ikwupụta mmadụ nwara igbu onwe ha dịka mpụ, ma na-eme ka ndị na-anwa igbu onwe ha, ghara ịchọ enyemaka, ma na-eme ka ezinụlọ zoo mgbalị igbu onwe ahụ dịkwuo elu ma na-ebelata ohere nke inweta ozi ziri ezi maka ijikwa mgbalị n'ọdịnihu
Mana kedụ ihe mere ọtụtụ ndị Nigeria ji anwa igbu onwe ha?
Ụfọdụ ihe nwereike ime ka mmadụ chee echiche igbu onwe ya gụnyere ọrịa uche, nsogbu mmekọrịta, ọnwụ, iji ọgwụike eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi, ọnọdụ ahụike, nsogbu ezinụlọ, nrụgide sitere n'agụmakwụkwọ maọbụ ọrụ, na ịnọpụ iche n'etiti mmadụ na ibe ya.
Mana nnyocha ndị e mere na Nigeria na-egosikwa na nrụgide ego, enweghị ọrụ, nsogbu mmekọrịta, nrụgide agụmakwụkwọ na nsogbu uche na-eme ka mmadụ na-anwa igbu onwe ya, tinyere ihere gbasara ahụike uche gburugburu.
Nnyocha afọ 2025 jụrụ mmadụ 200 ajụjụ n'ofe steeti dị iche iche na mmadụ 50 ndị gbanarịrị ọnwụ n'oge igbu onwe ha zara ajụjụ ọnụ yana ndị ọkachamara ahụike uche chọpụtara nrụgide ego, nsogbu ahụike uche, nsogbu mmekọrịta, nrụgide agụmakwụkwọ na ihere dịka ihe ndị dị mkpa na-akpata mmadụ igbu onwe na Nigeria.
Nnyocha ahụ gosikwara njikọ dị n'etiti nrụgide ego na nsogbu uche na echiche igbu onwe, ọ bụ ezie na nke a abụghị ihe akaebe doro anya na nrụgide ego kpatara igbu onwe.
Ọ dị mkpa igosi na: "Nrụgide ego anaghị akpata igbu onwe, mana njikọta nke nrụgide ego na ihere gbasara ahụike uche na-eme ka o yie ka onye ọnọ n'ọnọdụ abụọ nwaa igbu onwe ya, ọkachasị ma ọ bụrụ na ha enweghị ohere ịnweta ọgwụgwọ dị ọnụ ala na nke dị ire na ọrụ enyemaka mberede.



























