Anyị chọrọ itinye okporoụzọ East-West Road n'ime Lagos-Calabar Coastal Highway - David Umahi

Foto David Umahi oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi, ekwuola na ọbụghị eziokwu na gọọmenti etiti akwụsịla ọrụ n'okporụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway.

Umahi kwuru nke a oge BBC News Igbo kpọtụụrụ ya n'ekwentị iji chọpụta nke bụ eziokwu banyere akụkọ fesara na soshal midia na-ekwu na gọọmeti ahapụla ọrụ usoro kporoụzọ ahụ ma malite ịrụ okporoụzọ East-West road.

N'ozi Umahi zitere anyị n'ekwentị, ka o kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị abụghị eziokwu ma kọwaa na ọrụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway ka na-aga n'ihu dịka o kwuru na ogologo okporoụzọ ahụ ka bụ 750km.

Umahi gara n'ihu kwuo na ihe ọhụrụ gọọmenti chọrọ ime banyere akporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway bụ ịgbakwụnye ọrụ okporoụzọ East-West Road.

O kwuru na gọọmenti mere ụdịrị mgbankwụnye a n'ọrụ okporoụzọ Akwanga-Maiduguri-Wukari-Langtan Road.

Ọ kọwara na gọọmenti na-eme nnyocha na mpaghara ogologo ụzọ Lagos-Calabar Coastal road ahụ dị n'Edo, Delta, Rivers steeti na Bayelsa steeti iji gbakwụnye ya n'agba ise n'okporoụzọ ahụ nke dị n'Akwa Ibom steeti.

Ihe anyị ma maka akụkọ ịgbanwe usoro okporoụzọ Lagos-Calabar Highway

Foto minista na-ahụ maka ọrụ bụ Dave Umahi dịka o na-eleta etu ọrụ si aga n'okporoụzọ Lagos-Coastal Highway

Dịka akụkọ banyere ịgbanwe etu ọrụ si aga n'ihu n'okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway malitere ifegharị na soshal midịa, ọtụtụ mmadụ amalitela ịjụ ihe kpatara okwu mgbanwe a.

Akụkọ a malitere dịka otu ụlọọrụ mgbasaozi a kpọrọ Development Nigeria Tv na Youtube wepụtara ihe onyonyo ebe mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi kwuru na Onyeisiala Bola Tinubu kpebiri ka e jikọọ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway na okporoụzọ si Edo steeti gaa okporoụzọ East-West iji gbochie oke mkpamkpa idemmiri nakwa ajọ ọnọdụ opkoroụzọ ahụ kemgbe.

Mana ihe onyonyo a akpalitela ọtụtụ okwu na soshal midia dịka ọtụtụ ụmụafọ Nigeria malitere ịjụ ihe kpatara mgbanwe a.

Iji chọpụta nke bụ eziokwu, BBC Igbo gbara mbọ iji chọpụta ka ihe onyonyo ahụ ọ bụ eziokwu ka ọ bụ nke e ji akụrụngwa AI rụọ.

Anyị kpọrọ akara ekwentị mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi nakwa akara ekwentị ụlọọrụ ya, mana ha azaghị oku ekwentị niile anyị kpọrọ maọbụ zaghachi edemede ozi anyị zigaara ha.

Okporoụzọ Lagos-Coastal Highway

Ihe i kwesịrị ịma maka okporoụzọ Lagos-Coastal Highway

Ọ dị mkpa ka ị mara na ọ bụ n'ọnwa Febụwarị 2024 ka gọọmenti Nigeria mara ọkwa na ọ ga-arụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway mana ọ bụ n'ọnwa Mee 2024 ka Onyeisiala Bola Tinubu malitere ịrụ okporoụzọ a.

Okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway bụ otu ọrụ gọọmenti Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na ọ bụ ihe ha chọrọ ka e jiri cheta ọchịchị ya.

Okporoụzọ a nke e kwuru na ogologo ya ga-eru 700km, ga-amalite na Lagos ma gafee steeti itoolu ma nwekwaa ngalaba ga-abanye mpaghara ugwu Nigeria.

Foto okporoụzọ Lagos-Coastal Highway e ji ihe onyonyo droonu see

State itoolu ahụ gụnyere Lagos, Ogun, Ondo, Delta, Edo, Bayelsa, Rivers and Akwa Ibom.

Lagos State, Ogun State, Ondo State, Edo State, Delta State, Bayelsa State, Rivers State, Akwa Ibom State na Cross River State.

Na mbido, David Umahi kwuru na agba nke mbụ okporoụzọ a bụ okporoụzọ gbara abụọ bekee kpọrọ 'dual carriageway' nke ogologo ya dị 47.47km. Umahi kwuru na a ga-eji tarị naịra iri na ise (N15 trillion0 ka a ga-eji rụọ agba nke mbụ a ma kọwaa na ọ bụ kọnkịrị ka a ga-eji rụọ ya.

O kwuru na a ga-eji ijeri naịra anọ rụọ otu kilomita n'okporoụzọ a.

Kedụ ọnọdụ okporoụzọ East-West road ugbua?

Nnukwu ụgbọala tọrọ n'okporoụzọ East-West road maka oke idemmiri

Okporoụzọ East-West road bụ otu okporoụzọ dị oke mkpa na Nigeria ma bụrụkwa nke ọtụtụ mmadụ ji eme njem aga ebe dị iche iche.

Okporoụzọ a jikọrọ Delta state, Calabar, Port Harcourt nakwa Lagos state. Mana n'agbaneyeghị oke mkpa okproụzọ dị, ajọ ọnọdụ ya abụrụla ihe mgbu nye imirikiti ndị ji ya eme njem kwa ụbọchị.

Ndị ọchịchị kwuru na mpaghara okporoụzọ a dị na Ahoada dị na River state nakwa nke dị n'Ughelli Delta state, abụrụla ihe ọnọdụ dị oke njọ.

Na nso nso a, akụkọ gbara na soshal midia, gosiri ọtụtụ ndị njem tọrọ n'okporoụzọ a dịka ha na-akpọ oku enyemaka n'aka gọọmenti.

E kwuru na ihe kpatara ajọ ọnọdụ okporoụzọ a bụ oke idemmiri na-akpa mkpamkpa na mpaghara ahụ. Ọ bụ ya mere gọọmenti.