INEC adọọla aka na ntị maka 'Portal' adịgboroja mara ọkwa ibido ndebanye aha ndị chọrọ itu vootu na Nigeria niile

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Ọkacha mara, Joash Ojo Amupitan, na ozi adịgboroja na-efeghari n'itaneti.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ National Electoral Commission (INEC) amaala ọkwa ma dọọ aka na ntị maka 'website' adịgboroja mara ọkwa kwuo na ụlọọrụ ha na-ebido idebanye aha ndị mmadụ chọrọ iwete ikike ịtụ vootu na Nigeria niile.

'Website' adịgboroja ahụ kwuru na INEC ga-ebido ndebanye aha ndị mmadụ bido na Seputemba 28, 2026 ruo na Ọktoba 27, 2026.

Mana ụlọọrụ INEC ejirila maka nke a maa ọkwa n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'akara soshal mịdịa ha ma kwuo hoohaa na aka ha adịghị na nke ahụ.

INEC kọwara ọkwa ibido ndebanye aha ndị mmadụ chọrọ ịtụ vootu dịka aka ọrụ ndị na-egwu chamdum.

N'okwu ha "INEC na-anụ ihe 'website' ndị na-egwu mmadụ chamdum na-ekesagharị n'intaneti na-ekwu na INEC amaala ọkwa ibido ndebanye aha ndị chọrọ ịtụ vootu na Nigeria niile bido na Seputemba 28, 2026 ruo na Ọktoba 27, 2026".

"Ụlọọrụ anyị na-agwa onye ọbụla na nke ahụ bụ okwu asị, maka INEC na 'website' dere nke ahụ enweghị mmekọ ọbụla n'udi ọbụla".

"Website ahụ nke gbakwụnyere '...inecnigeria-cvr-org" bụ adịgboroja.

"Anyị na-agwa ohaneze niile ka ha hara imetu 'website' ahụ aka maọbụ gaa denye ndekọ ha ọbụla maka na nke ahụ nwereike ime ka e zuru ọtụtụ ndekọ banyere ha ma were ya mee ihe edoghị anya".

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Ọkacha mara, Joash Ojo Amupitan
Nkọwa foto, Joash Ojo Amupitan

Kedọ mgbe INEC kwụsịrị ndebanye aha?

Ụlọọrụ INEC ji ohere ahụ kwuo na ha akwụsịla ndebanye aha ndị chọrọ ịtụ vootu nke bekee kpọrọ "voter registration exercise" kemgbe July 26, 2026.

Ha kwuru na ozi ọbụla mmadụ wepụtara na-ekwu na a ga-enwe ndebanya aha ndị chọrọ ịtụ vootu ọzọ na Nigeria niile bụ okwu ụgha.

INEC gwara ohaneze ka fie isaa n'anya ma gbaa mbọ mara nke bụ eziokwu site n'iwete ozi si n'ụlọọrụ ha kpọmkwem pụta.