Ọ bụ onyike ka osote ọkwọụgbọelu jiri wakpoo ọkwọụgbọelu – Ọkaiwu mba UAE

Ebe foto si, Embassy of India in Israel, Getty Images
Nnukwu Ọkaiwu mba United Arab Emirates ekwuola na osote ọkwọụgbọelu ahụ chọrọ ịchịkwa ụgbọelu Flydubai na-aga Israel jiri onyike wakpoo ọkwọụgbọelu.
Ụgbọelu ahụ si Dubai na-aga Tel Aviv bu mmadụ karịrị otu narị na iri asaa (170), eferuola 17,000ft (5,200m) n'ime elekere abụọ na ọkara njem ahụ malitere tupu ndị njem ejisie ike napụ onye mwakpo ahụ ike ma chịkwaa ụgbọelu ahụ.
Captain Smit Machchhar kwuru na ya tọgbọrọ n'ala n'ihi mmerụahụ oge ọ ghọtara na ụgbọelu ahụ na-ada, nke mere o jiri nwaa ike ya.
Ọ kọwara sị: "Agwara m onwe m ka m kwaa ụzọ aka nke ikpeazụ iji si n'ime mepee ya", nke mere ka ndị njem bata.
Ndị ọkwọụgbọelu nchereoge abụọ fedara ụgbọelu ahụ n'udo na Saudi Arabia.
A na-edowekarị onyike n'akụkụ ebe ndị ọkwọụgbọelu nọ maka ọnọdụ gbatagbata.
Ngwaọgụ o jiri mee nwakpo ahụ bụ ajụjụ gbara ọkpụrụkpụ ndị nnyocha na-ajụ, n'ihi ọtụtụ nchekwa a na-ahazi maka okporo njem ahụ.
Ozi e nwetaburu site n'aka ndị njem nọ n'ime ụgbọelu ahụ na-arụtụ aka na o nwereike ịbụ mma ka o jiri mee mwakpo ahụ.
Nnukwu Ọkaiwu mba UAE gwara ụlọmgbasaozi mba ahụ na ndị nnyocha ga-achọpụta ọnọdụ niile butere mwakpo ahụ nakwa ebumnobi ya.
Osote ọkwọụgbọelu mere mwakpo ahụ bụ nwaafọ mba Oman, dịka Praịm Minista mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu siri kwuo.
Ọtụtụ ụlọmgbasaozi gụnyere Reuters, CNN nakwa The New York Times ekwupụtala aha ya dịka Hamam al-Hammami, mana ndị ọ dị n'aka e mebeghị ka a mata ma nke a ọ bụ eziokwu.

Ebe foto si, Screengrab
Ụlọmgbasaozi mba America kwuru na e wezugara Hamam al-Hammami ebe ọ na-anara ọzụzụ n'ihi etu o si eche echiche mgbe ọ na-arụ ọrụ n'Oman Air, ma nye ya ọrụ ọzọ.
Ọ gụchara akwụkwọ na mahadum Buckinghamshire New University dị na mba UK ma nweta nzere n'ihe gbasara nlekọta njem ụgbọelu n'afọ 2023, ka mahadum ahụ kwuru.
Mana ha gbakwunyere na ọ nataghị ọzụzụ ọbụla metụtara ịkwọ ụgbọelu n'ụlọakwụkwọ ahụ.
Oge ọ na-agwa ụlọmgbasaozi Fox News okwu, Netanyahu sịrị na oge a napụrụ onye mwakpo ahụ ike, ọ gwara ndị ọrụ njem ụgbọelu sị "gbuo m, gbuo m!"
Praịm Minista Izrel gbakwunyere sị: "Ọ bụ ihe doro anya na ọ chọrọ igbu mmadụ...Ọ dị nnọ ka ọ chọrọ ịkpọ ụgbọelu ahụ isi n'ala."
Netanyahu kwukwara na onye ahụ mere mwakpo "gara ọzụzụ maka ndị chọrọ ịbụ ndị okpukperechi Alakụba na-egbu ka mmanya".
Dịka ụlọmgbasaozi dị na mba United Arab Emirates siri kwuo, mba UAE amalitela inyocha ma "o nwere ihe jikọrọ ọdachi ahụ na omume iyi ndụ egwu".
Machchhar, onye a sụrụ mma n'oge mwakpo ahụ, ka e bugara n'ụlọọgwụ dị nso tupu e jiri ụgbọelu bugaa ya Abu Dhabi, ebe a sịrị na ọ nọ ugbua na-enweta onwe ya.
























