Aguleri na Umuoba Anam: Ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela anya n'ọgbaaghara dapụtara n'etiti obodo abụọ ahụ

Ebe foto si, Nigeria Police
Ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela anya n'ọgbaaghara dapụtara n'etiti obodo Aguleri na Umuoba Anam dị n'Anambra steeti.
Ọnọdụ a na-abịa dịka ụfọdụ onyonyoo fegharịrị n'ikuku gosiri ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ ha.
N'onyonyo ahụ ụda egbe na-ada aghara aghara.
Onye a nụrụ olu ya n'otu onyonyoo gwara ndị mmadụ ka ha zere ịga n'obodo Umueri maọbụ Aguleri n'ihi na esemokwu atọpụla ọgọdọ ma gbarazie ọtọ n'etiti ha.
Mana akwụkwọ ozi ndị uweojii wepụtara na-egosi na ebe nsogbu ahụ dapụtara bụ n'etiti Aguleri na Umuoba Anam.

Ebe foto si, Nigeria Police

Ebe foto si, Nigeria Police
Ozi ndị uweojii wepụtara maka nke a
Kọmịshọna ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Nnanna Oji Ama agaala jiri anya ya hụ ka ọnọdụ nchekwa dị n'obodo Aguleri na Umuoba Anam, n'ihi ọnọdụ tigbuo zọgbuo dapụtara n'etiti ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kọọrọ anyị sị ooo na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde 2 Ọktoba 2026 ka kọmịshọna ndị uweojii gara njem ahụ, nke ndị so ya gụnyere Onyekachukwu Ibezim bụ osote gọvanọ Anambra steeti, ndị nchekwa nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu.
Dịka Ikenga siri kwuo, njem ahụ bụ ohere iji tulee ọnọdụ nchekwa, chọpụta nke bụ eziokwu gbasara ndị e gburu egbu, nyochaa ngwonwgo ndị e mebiri, ma marakwa ogogo ya bụ ọnọdụ jiri metụta ndị bi n'ogbe ahụ.
Kọmịshọna ndị uweojii ahụ kwere ndị bi n'Aguleri na Umuoba Anam nkwa na a ga-akwalite ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ iji weghachi udo ma gbochie ọgbaaghara ịga n'ihu, dịka ọ sịkwara ha dere duu ma gaa n'ihu na-agbakọrọ ndị ọrụ nchekwa aka site n'inye ha ozi ndị bara ezigbo uru.
N'okwu nke ya, Osote gọvanọ Anambra Steeti kpọkuru ndị eze ọdịnaala, ndị ndu obodo, otu ndị ntoroọbịa nakwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu, ka ha gbakọọrọ gọọmenti aka iji nweta udo ga-adịgide adịgide n'obodo ndị ahụ.




























