Lee ihe mahadum Madonna chọrọ ime ụmụakwụkwọ nọọsụ mere ihe nkiri e dere 'Arịakwala ahụ maka na ọ bụ ndị Gen-Z juru n'ụlọọgwụ'

Ụmụakwụkwọ nọọsụ Madonna University na-agba egwu n'onyonyo na-ese okwu.
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

'Arịakwala ahụ maka na ọ bụ ndị Gen-Z juru n'ụlọọgwụ' bụ okwu na-ese okwu ugbua n'etiti Madonna Unversity nakwa ụmuakwụkọ nọọsụ ha.

Etu nke a si bido bụ na ụmụakwụkwọ nọọsụ Mahadum Madonna mere ihe nkiri ebe ha na-egbe egwu ma dee edemede n'elu vidiyo ha kesara n'intaneti sị "Arịakwala ahụ maka na ọ bụ ndị Gen-Z juru n'ụlọọgwụ'.

Okwu ahụ ha bụ nke kpalitere iwe Mahadum Madonna bụ ndị kwuru na ha ga-achụpụ ụmụakwukwọ ahụ na mahadum ha dịka ụlọọrụ mgbasaozi n'ime obodo Nigeria si kwuo.

Chima Achu bụ ọnụ na-ekwuru Mahadum Madonna gwara ụlọ mkpasaozi Premuim Times na "ọ bụ eziokwu na ha chọrọ ịchụpụ ụmụakwụkwọ nọọsụ ndị ahụ maka na ha mere vidiyo ahụ na-enwuewu n'ime ụlọọgwụ mahadum ahụ ma dee ya 'arịakwala ọrịa maka na ọ bụ ndị Gen Z juru ụlọọgwụ".

Achu kwuru na mgbe na-adịghị anya na ndị isi ụlọọrụ mahadum ahụ ga-agwa ohaneze mkpebi ha were banyere okwu ahụ.

Ụmụakwụkwọ nọọsụ Madonna University na-agba egwu n'onyonyo e dere ihe na-ese okwu.

Okwu ndị NANs maka ịchụpụ ndị nọọsụ ahụ na Mahadum Madonna

Otu jikọtara ụmụakwụkwọ na Nigeria bụ National Association of Nigeria Students , NANs arịọla biko maka ịchụpụ ndị nọọsụ ahụ na mahadum Madonna dịka ntaramaahụhụ.

Onyeisi otu NANs bụ Akinteye Babatunde Afeez bụ onye wepụtara ozi ahụ n'akara soshal midia ya kwuru sị na ọ bụ eziokwu na ihe ụmụakwụkwọ nọọsụ ndị ahụ mere adịghị mma dịka usoro ọrụ na agụmụakwụkwọ ha si dị mana ka e mere ha ebere ma nye ha ntaraamahụhụ na-agaghị egbochi ịgụcha akwụkwọ ha.

Akinteye Babatunde Afeez rịọla ndị isi mahadum Madonna ka ha tulee ntaramaahụhụ ha chọrọ inye ụmụakwụkwọ ndị ahụ ma kwuo na nke a nwereike ịkwasa ọganihu, ọdịmma, nakwa ọnọdụ ahụike ụbụrụ ụmụakwụkwọ ahụ ma a chụọ ha.

Akwụkwọ ozi ndị NANs wepụtara na-arịọ biko maka ndị nọọsụ ahu Mahadum Madonna chọrọ ịchụ.

O kwuru na ugbua na ụmụakwụkwọ nọọsụ ndị ahụ amarana na ihe ha mere megidere usoro agụmụakwukwọ na-akwa ọrụ nọọsụ ma na-enwe ọmị iko ugbua.

Ma kwuo na 'ntaramaahụhụ kacha bụ nke ga-enyere mmadụ aka ma gbaziere ya ụzọ ma nyekwa ya ohere ịmụta ihe site n'ihe o mejọrọ".

Ọ kwuru ka ihe a hara ịbụ nke ga-emebi ọ dị n'ịhu ụmụakwụkwọ ahụ maọbụ gbochie ihe ha chọrọ ịbụ.

Nkenke ihe i kwesiri ima maka Mahadum Madonna

  • Madonna University bụ mahadum nke ụka Katọlik.
  • O bidoro n'afọ 1999 na Nigeria.
  • Ọ were ntọnaala nkuzi ụka katọlik.
  • Ọ were ngalaba ụlọ akwụkwọ ha dị n'Elele Rivers Steeti, Okija n'Anambra Steeti nakwa Akpugo n'Enugu Steeti