CAF ga-ekpebi ikpe onye meriri Afcon 2025 n'ụbọchị Tuesday

Ndị mba Senegal na-enwe aṅụrị dịka ha buliri iko Afcon nke afọ 2025
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe mkpesa egwuregwu a kpọrọ 'Court of Arbitration for Sports' (CAS) ga-ekpebi ikpe gbasara onye meriri asọmpi 'Africa Cup of Nations (Afcon) nke afọ 2025, n'ụbọchị Tuzde, abalị 24 ọnwa Nọvemba afọ 2026.

Cheta na egwuregwu ikpeazụ nke asọmpị ahụ bụ n'etiti mba Morocco na Senegal, ebe Senegal jiri otu ọkpụ goolu merie ma bulie ya bụ iko Africa.

Mana Morocco mechara nye mkpesa, na-ebo ebubo na a gbasoghị iwu na-achịkọta asọmpi ahụ, maka na Senegal gbahapụrụ ya bụ asọmpi n'iwe oge a na-agba ya, nke pụtara na o kwesịrị ka a kpọpụta Morocco dịka ndị meriri asọmpi ahụ.

Otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ n'Africa bụ 'Confederation of African Footbal (CAF) hibere otu nnyocha maka ya bụ mkpesa, bụ ndị kwuru ka ha mechara nnyocha ha, na ọ bụ Morocco ka e kwesịrị ibunye iko Afcon 2025 n'ihi na Senegal gbahapụrụ egwuregwu ahụ.

Mana Senegal wegara mkpesa n'ụlọikpe mkpesa egwuregwu bụ CAS n'ọnwa Maachị afọ a, iji gbaghaa ihe ahụ otu nnyocha CAF kwuru, ma kwuo na egwuregwu ikpeazụ nke asọmpi Afcon 2025 ruru n'isi, ha bụ Senegal ejiri otu ọkpụ goolu merie, ọ bụ ihe ọjọọ onye ọbụla ikwu ka a napụ ha iko ha meriri n'anya ọcha.

Ndị ọkaiwu atọ na CAS, nke onyeisi ha bụ ọkaikpe mba France gbara afọ 76 bụ Gerald Simon, nụrụ mkpesa a ndị Senegal wetara n'ọnwa Ọktoba, ma kwuo na ha ga-ekwupụta ihe ha kwekọrịtara n'oge adịghị anya.

N'ụbọchị Monde a, ụlọikpe CAS wepụtara ozi na ha ga-ekwupụta mpụtara ikpe ha n'ụbọchị Tuzde iji kwuo hoohaa ndị a ga-akpọpụta dịka ndị tuuru ugo n'asọmpi Afcon nke afọ 2025.

Nogidesie ike na BBC News Igbo dịka anyị ga-ewetara gị mkpebi ha ngwangwa ọ pụtara.