Ana m enwe nsogbu ọkụ latrịk, enweghị mmiri n'obi ọchịchị 'Presidential Villa' – Tinubu

Onyeisiala Nigeria, Bola Tinubu
Nkọwa foto, Bola Tinubu
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ya na-enwe nsogbu enweghị ọkụ latrịk, mmiri nakwa ụfọdụ nsogbu ụmụamaala Nigeria na-enwe.

Bola Tinubu kwuru nke a n'ọgbakọ o nwere na Lagos state n'ime abalị garaaga bụ ebe o zutere ndị eze obodo nakwa ndị isi okpukperechi dị icheiche.

Tinubu bụ onye tinyere ọnụ n'ihe dị iche iche banyere ọnọdụ nchekwa na mmepe obodo gwara ndị mmadụ ihe ọ na-agabiga n'obi ọchịchị onyeisiala Bekee kpọrọ Presidential Vila dị n'Abuja.

N'okwu ya "Ọ bụrụ na m nọtee aka na Legos state agaghị m achọ iji ọsọ ọsọ gaghachị Abuja.

"Mana ka m gwa ọtụtụ n'ime unu, n'ubochi Wenezde n'izu ụka gara-aga, a na m akpụchasị ajị n'ebe ịsa ahụ n'oge mmiri kwụsịrị ịgba.

"Nke a mere n'obi Ọchịchị Onyeisiala '(Presidential Villa)'."

"Ị maghị na ntaramahụhụ dị n'ebe ahụ kwa?. Mmiri kwụsịrị ịgba".

"Mana anyị ga-emezi ọnọdụ enweghị mmiri, enweghị ọkụ latrịk na-enweghi ezigbo mmepe obodo".

"Anyị ka na-ebido ebido, anyị ga-emewu ya ma meere ya ụmụ Nigeria".

Ihe Onyeisiala Tinubu gwara ndị Lagos maka ntuliaka 2027

Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọzọ

Ọzọ Onyeisiala Bola Tinubu gwara ụmụ afọ Lagos state ka ha pụta n'igwe tụnyere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya bụ All Progressive Congress (APC) vootu na ntuliaka 2027.

Tinubu kwuru sị "ihe iche aka mgba dị ugbua dị mfe karịa nke dị n'oge garaaga mana anyị agaghị eji ya egwu egwu".

"Gaa n'ọnụ ụzọ ndị agbata obi unu kụọ aka, gwa ha gaa nata PVC ha maka na ọ bụrụ na ị jide PVC gị ya abụrụ na ị ga-atụ vootu na ntuliaka January 16, 2027 nakwa February 6th, 2027".

"Anyị ga-enwete vootu ga-ezu ma karịa nke ndị anyị na ha na-azọ ọchịchị".

Tinubu kpọrọ oku udo na mgbaghara n'etiti ndị APC

Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọzọ.

Onyeisiala Bola Tinubu ji ohere ahụ kpọọ oku mgbaghara n'etiti ndị otu All Progressives Congress, APC ma rịọ ha ka ha jikọọ aka ọnụ nọrọ n'udo.

Tinubu kwuru na ozi ya na-agara onye ndụmọdụ ya pụrụiche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Alhaji Ibrahim Kabiru Masari na onye bụbu Mịnịsta nchekwa bụ Alhaji Abubakar Badaru.

Tinubu ji ohere ahụ tinye ọnụ n'akụkọ banyere nghọtafe dị n'etiti Gọvanọ Dikko Umar Radda na Masari nke Katsina State ma gwa Masari ka ọ gaa ka ya na gọvanọ ya mezie.

N'okwu ya "Alhaji Kabiru Masari lọghachi ụlọ gaa mee udo n'etiti onye ọbụla. Nke a bụ iwu Onyeisiala na-enye gị. Mgbe ị mechere nke a, ị gaa Jigawa. Ị gaa n'ebe ndị ọzọ ma mee ka ha nwee udo ma rịọ ha biko maka na anyị chọrọ udo nakwaa ime ka iwe ndị mmadụ beleta ma kwụsị".