Daniel Amokachi, Samson Ehomhe, Joe Abah na ndị ọzọ FIFA họpụtara ilekọta otu NFF

Daniele Amokachi, Joe Abah na Samson Ehomhe na njirimaara otu NFF
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

FIFA bụ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mbaụwa ahọpụtala ndị ga-elekọta otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Nigeria bụ Nigeria Football Federation (NFF) ruo mgbe a ga-eme ntuliaka ịhọpụta ndịisi otu ahụ.

FIFA kpọrọ otu ahụ Normalisation Committee ma sị na ha ga-anọ n'ọrụ ahụ malite ugbua ruo n'ọnwa Mee afọ 2027.

FIFA ziteere NFF ozi banyere nhọpụta ndị a n'ụbọchị 18 Nọvemba 2026 nke otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Africa bụ Confederation of African Football (CAF) maara maka ya.

Ha họpụtara onye ọkaiwu a ma ama bụ Samson Ehomhe dịka onyeisioche,ebe ndị ọzọ gụnyere;

Onye ntaakụkọ a ma ama bụ Godwin Enakhena, Daniel Amokachi gbabuuru Super Eagles bọọlụ, Amina Yerima na Joe Abah.

Ndị a ga-amalite ọrụ ozugbo ma ọ bụrụ na otu nnyocha FIFA hiwere mechaa nnyocha banyere ha nakwa omume ha.

FIFA gara n'ihu kwuo na onweghi onye ọbụla n'ime ndị a họpụtara ga-etozuoke ịzọ ọkwa na ntuliaka ịhọpụta ndịisi NFF na-abịa abịa.

Akwụkwọ ozi e ji họpụta ha

Kedụ ọrụ kọmitii a ga-arụ?

Ọrụ ndị kọmitti a gbagidere ụkwụ na-achịkọta etu otu NFF si arụ ọrụ mana ha ga-eleba anya na ntọala otu NFF nakwa ihe banyere ntuliaka ha.

Ha ga-eleba anya n'ịhazi ndị so n'otu NFF ma belata ọnụọgụgụ ha.

Ha na FIFA na CAF ga-arụkọ ọrụ n'inyocha iwu na-achịkwa NFF ma maara ma o nwere nke a ga-agbanwe.

Ọrụ ọzọ dị mkpa bụ na kọmitii a ga-ahụ maka ịhazi ntuliaka ịhọpụta ndịisi ọhụrụ nke NFF

Ọrụ kọmitii a ga-akụrụ ọnụ ngwa ngwa ha rụchara ọrụ ha mana ọ gaghị afafe ụbọchị 31 Mee afọ 2026.

Ihe butere nhiwe Normalisation Committee a

Cheta na nsogbu dapụtara n'etiti nke mere onyeisioche ha bụ Ibrahim Gusau na ndịisi ndị ọzọ jiri gbaa arụkwaghịm n'ụbọchị 27 Ọgọst 2026.

Nke a metụtara ọgbakọ ukwu maka ntuliaka ha chọburu ime n'ụbọchị 27 Sepụtemba 2026 nke mere FIFA na CAF jiri bata n'okwu ahụ.

N'ihi ya, FIFA jiri kwadoo ka e hiwe Normalisation Committee a n'ụbọchị 20 Ọktoba 3036, iji lekọta NFF ruo mgbe a ga-eme ntuliaka ịhọpụ ndịisi ọhụrụ.