Ndị ntoroọbịa Nigeria egosila ike ha na mbụ - gịnị mere ha anaghị agbanwe etu ntuliaka a si ịga?

Ụmụnwaanyị ise ji ụchafụ na-acha ka ihu eluigwe fụchie isi Five nke gosiri uwe njirimaara pati APC ma welie mkpịsịaka anọ elu. N'azụ ha bụ foto Bola Tinubu mgbe o yi okpu na-acha mme mme
Nkọwa foto, Bola Tinubu (kpuu okpụ mme mme) ga-adị afọ 79 mgbe ọ ga-achịcha nke ugboeo abụọ
    • Onye dere ya, Mansur Abubakar
    • Ebeg o si, Abuja
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Abdulhadi Dalhatu bụ otu n'ime ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị ahụkebe na Naịjirịa.

Mgbe ọ dị afọ 38, ọ na-achọ ịbụ otu n'ime ndị ntoroọbịa a ga-ahọpụta n'ọkwa n'obodo ebe pasent 80 mmadụ bi na ya erubeghị afọ 40.

O nwere olileanya na afọ ole ọ dị ga-enye ya ihuọma dịka ọ na-achụ nta vootu maka ịzọ n'ụlọomeiwu Kano State dị n'Ugwu Nigeria na ntuliaka a ga-eme n'ọnwa Jenụwarị.

Dalhatu gwara BBC, sị: "Ndị ntoroọbịa bụ ndị kachasị n'ọnụọgụgụ na mba, ha kwesịrị ịbụ ndị na-ekpebi ọdịnihu obodo a."

Mana akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa na-egosi na o nwere ihe nnukwu ịma chere ya ihu.

Kemgbe e weghachiri ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999, Goodluck Jonathan bụ onye kachasị nta n'afọ ga-achị Nigeria dịka onyeisiala dịka ọ banyere mgbe ọ dị afọ 53.

Onyeisiala nọ ugbua bụ Bola Tinubu, dị afọ 74, ma ọ bụrụ na a họpụtakwa ya ọzọ na Jenụwarị, ọ ga-adị afọ 79 mgbe oge ọchịchị nke abụọ ya ga-agwụ.

Ndị na-azọsị ya ọkwa gbagotara n'afọ dịka Atiku Abubakar onye na-azọ ọkwa onyeisiala ugboro asaa dị afọ 79, ebe Peter Obi dị afọ 65.

N'ime mmadụ iri na asatọ na-azọ ọkwa, naanị otu onye nọ n'okpuru afọ 40. Ọ bụ Moses Olusoji Adebisi, onye achụnta ego dị afọ 35 nke na-anọchiteanya otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na-akpọ Democratic Leadership Alliance (DLA).

N'agbanyeghị na ọ na-ekwu na o nwere ntụkwasịobi na ọ ga-emeri, ọtụtụ ndị Naịjirịa amaghị ya nke ọma, a hụbekwaghị ọfụ ebe ọ na-eme achụmnta vootu.

Ọ bụ ihe ndịiche na mba nwere otu n'ime ọnụọgụgụ ndị ntoroọbịa kachasị ukwuu n'ụwa, ebe ndị ntoroọbịa egosila ugboro ugboro na ha nwere ike idu mkparịtaụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma kpọkọta ndị mmadụ ka e nwee mgbanwe.

Na ntuliaka gara aga, mgbe ahụ Obi dị afọ 61, ọ kpokọtara ọtụtụ nde mmadụ bụ ndị ntoroọbịa Naịjirịa site na mgbasaozi soshal midia nke mụpụtara otu a kpọrọ "Obedients."

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya gbagidere ụkwụ n'ikposa usoro ndọrọ ndọrọ dị bụ adị nke ọtụtụ ndị ntoroọbịa ọkachasị ndị na-enweghi ọrụ nabatara.

Mana ọdịda ya n'ịbụ onyeisiala mere ka ọtụtụ ndị nkwado ya daa mba n'obi.

Onye bụbu onye otu Obedients bụ Nonso Chukwudi, gwara BBC, sị:

"N'oge ahụ, anyị nwere nnukwu olileanya, mana ọ dị mwute ikwu na mpụtara ya abụghị ihe anyị chọrọ. Nke ahụ mere ka ọtụtụ mmadụ tufuo ntụkwasịobi ha n'usoro ọchịchị ahụ."

Ngosi nke otu ahụ wuru ewu bụ nke sitere na ntọala ngagharịiwe EndSARS nke afọ 2020, nke ghọrọ otu n'ime otu ndị ntoroọbịa kachasị ukwuu pụtara na Naịjirịa n'ime ọtụtụ iri afọ.

A kọwara na ihe dịka mmadụ iri ise na isii nwụrụ n'oge ngagharịiwe ahụ, mana ndị nọ n'ọchịchị jụrụ ọnụọgụgụ ahụ. E jiderekwa ọtụtụ narị mmadụ, ebe e mechikwara ụfọdụ ọbaego ha.

Mana ngagharịiwe EndSARS na otu Obedients gosipụtara na ndị ntoroọbịa Naịjirịa nwere ikike agbakọta ọnụ ma weta mgbanwe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigerian bụ Abdulhadi Dalhatu yi uwe ọdịnala ma kpuru okpu mee mea a kara
Nkọwa foto, Abdulhadi Dalhatu nwere olileanya ịbụ onyeisiala n'otu ụbọhị mana ọ na-ebe akwa nsogbu ego cheere ya aka mgba.

Mana ịtụgharị ọnụnụ ọkụ n'obi ahụ ka ọ bụrụ nke e ji esonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị abụrụla ihe siri ike.

Hajara Musa dị afọ 33 so n'otu n'ime ndị okwukwe ha dara n'ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O nweghi atụmatụ idebanye aha maọbụ tụọ vootu n'ọdịnihu.

"Ọ dị m ka ekpebiela ihe niile, ọ bụ oge m ka m ga-egbu. Ọ ga-abụ otu ndị ahụ ọzọz", ka ọ gwara BBC

Ọnụọgụgụ ndị debarala aha maka ịtụ vootu ji nde 10 gbagoo elu karịa nde 103 kamgbe ntuliaka gara aga. Ndebanye aha ndị nọ n'okpuru afọ 35 ji nde asaa gbatuo ala.

Pasentị ndị ntoroọbịa debara aha dị naanị 29 site na 40 pasentị (40%) n'afọ 2023.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec kwuru na ọ gbaala mbọ ịkwalite ndị ntoroọbịa ka ha debanye aha maka ntuliaka afọ 2027.

Nke gụnyere ịhọpụta ndị nnọchịteanya si na ngalaba na-ahụ maka inwe aṅụrị, site n'ihe nkiri, iti egwu nakwa ịkpaọchị iji rite mkpụrụobi ndị ntoroọbịa.

Mana ọnụọgụgụ gosiri na mgbọ niile amịtabeghi mkpụrụ a hụrụ anya.

Dalhatu na ọ maara na nke a na-ada mba mana sị na ọ bụrụ ndị ntoroọbịa chọrọ mgbanwe na ha ga-esonye n'usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

"Ọ dị mwute na ọtụtụ na-achọ ịnọ na soshal midia na-ezipu ozi" karịa esonye n'ihe a na-eme.

Nwagbọghọ na-akwado pati APC na Nigeria yi uwe na-egosi njirimaara pati ha.
Nkọwa foto, Pasentị ndị ntoroọbịa debara aha dị naanị 29 site na 40 pasentị (40%) n'afọ 2023.

Dalhatu nwere ebumnobi ịbụ onyeisiala otu ụbọchị, mana sị na ọ gbahapụrụ achụmnta vootu n'ihi enweghi ego.

Ego ọ na-efu iji azọ ọkwa ọchịchị na Nigeria dị ukwuu n'ụzọ dị egwu.

Dịka iwu ntuliaka si kwuo, onye na-azọ ọkwa onyeisiala nwereike imefu ijeri naịra ise (£2.8m; $3.7m) n'ịchụnta vootu na ntuliaka 2023. Mana ego mmefu ahụ amụwanyela karịa ụzọ abụọ.

Ego e ji azụta akwụkwọ igosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala emeela ka ọtụtụ ndị ntoroọbịa gbaara echiche ahụ ọsọ.

Patị nọ n'ọchịchị All Progressive Congress (APC), pati Peoples Democratic Party (PDP) na pati African Democratic Congress (ADC) dosara ego e ji azụ akwụkwọ mmasị na nde naịra 100 ($74,000; £56,000), nke mere o jiri sie ike ndị ọhụrụ igosi mmasị.

Kamgbe ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachịrị na 1999, naanị pati abụọ chịrịla Nigeria - PDP site na 1999 ruo 2015 na APC kamgbe 2015.

Ndị chọrọ ịzọ ọkwa na-enweghi ego iji zụta akwụkwọ ngosi mmasị nakwa ịzọ ọkwa na ntuliaka ime ụlọ enweghi ohere ọbụla ịbụ onyeisiala.

Ihe ọgbatauhie ahụ pụtakwara ihe n'ụlọomeiwu Nigeria.

Onweghi otu n'ime ndị Sịnetọ nọ n'okpuru afọ 40, ebe naanị mmadụ 14 n'ime mmadụ 360 n'ime ụlọomeiwu nnọchịteanya nọ n'okpuru afọ 40.

"Anọọla m na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kamgbe ọtụtụ afọ, ndị ntoroọbịa na mba a enweghi akụrụngwa eji abụ onyeisiala," ka Dalhatu na-azọ ọkwa n'aha Nigeria Democratic Party (NDC) kwuru

Atiku Abubakar yi uwe na-acha ka ihu eluigwe nakwa okpu jiri igwe e ji ekwu okwu
Nkọwa foto, Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro asaa

Fatima Zahra Umar, onye ntoroọbịa na-eme ndọrọ ndọrọ n'APC anwaala na mbụ ịzọ ọkwa n'ụlọ nnọchiteanya, kwetere na nke a.

"Ndị ntoroọbịa Nigeria dara ogbenye. Ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria na-efu nnukwu ego, ọ bụ ego na-enye ntuziaka ya," ka o kwuru, ma gbakwụnye na a na-akpọkaarị ndị ntoroọbịa ndị na-eme ejije soshal midia, ndị naanị ihe nwereike ịbụ bụ ndị ndụmọdụ pụrụiche nye onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Seun Ajayi kwenyere na nsogbu ahụ karịrị naanọ n'ihe ego

"Anyị nwere ụfọdụ ndị ntoroọbịa kachasị maara na mbaụwa, mana ọ ga-abụ na uche ha adịghị ya maọbụ na afọ anaghị eju ha ma e nye ha obere ọkwa na gọọmenti," ka o kwuru.

"Ndị okenye agaghị anọ ebe ahụ na-ele anyị anya ka anyị chụpụ ha. Anyị kwesịrị ịlụ ọgụ dị na ya, mana ka ọ dị ugbua anaghị m ahụta ụdịrị ọnụnụ ọkụ n'obi ahụ.

Umar kwenyere na agwa a na-akpasị ndị ntoroọbịa bụ ndị ndu dịkwa oke mkpa.

"A bịa n'omenala, anyị anaghị atụkwasịkaarị onye ntoroọbịa maara ihe nke ukwuu obi, ya mere ọ ga-ara ahụ," ka o kwuru.

"Ndị okenye ka jisiri ọchịchị ike."

Ụfọdụ ndị Nigeria nwetere ihe mkpalite mmụọ site na ntuliaka 'midterm election' nke mba America mere, ebe ụfọdụ ndị meriri nwere agbụrụ n'Africa.

"America emeela ya, Nigeria onwereike ime ya?" bụ ihe onye na-akpaṅụrị bụ Charly Boy dere n'akara X ya bụ nke ekesara nke ukwuu.

O kwuru na mpụtara ntuliaka America bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria, na-agbanyeghi etu onye si gbaa mgbọrọgwụ, na ndị na-atụ vootu nwereike ịgbanwe gọọmenti.

Ọ kpọkuru ndị ntoroọbịa ka ha kpaa ndị chọrọ ịzọ ọkwa ajụjụ banyere nkwa ndị ha kwere:

"Ndụ ọ dịkwuola mma? Kedụ ebe ọrụ dị, nchekwa na ibi ndụ ọnụala?

"Ọchịchị onye kwuo uche ya abụghị egwuregwu nlereanya, maọbụ ikesa osikapa," ka o dere.