Gịnị ga-eme n'ụlọụka Fountain of Life Church n'oge ofufe ha n'ụbọchị ụka a?

Ebe foto si, Fountain of Life Church/Facebook
Esemokwu na nghọtahie dị n'etiti ndị ndu ụlọụka Fountain of Life Church a kpọrọ Incorporated Trustees na onyeisi nchụaja ha bụ ụkọchukwu Jimmy Odukoya abanyela ihe ọzọ dịka ha agaala n'ụlọikpe iji lebara okwu ahụ anya.
Nke a na-abịa dịka Ụkọchukwu Jimmy Odukoya bụ onyeisi ndị ndu ụlọụka a gbara akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu dị na Lagos na Fraịde 20 Nọvemba 2026 megide mmadụ asatọ ndị ọzọ na mkpebi ha iwepụ ya dịka onyeisi nchụaja nke ụlọụka ahụ.
Mmadụ asatọ a kpọro aha n'akwukwọ ikpe FHC/LAG/CS/1568/2026 gụnyere; Ụkọchukwu Tolu Odukoya, Biodun Balogun, Biodun Awosika, Ụkọchukwu Rotimi Okpaise, Ụkọchukwu Tobi Enuha, Ụkọchukwu Gbenga Onabanjo, Ụkọchukwu Fred Ohiani na Ụkọchukwu Akin Osinbajo.
Gịnị bụ isiokwu akwụkwọ Ụkọchukwu Jimmy gbara n'ụlọikpe?
Akwụkwọ ikpe ahụ katọrọ ọgbakọ a sị na ndị ndu ụlọụka ahụ nwere na 22 Jenụwarị, 28 Febụwarị na16 Nọvemba 2026 nakwa mkpebi ndị nwere n'ọgbakọ ndị a.
Isi sekpu ntị bụ mwepụ ha wepụrụ Ụkọchukwu Jimmy Odukoya dịka Onyeisi nchụaja nakwa Onyeiisi ndị ndu ụlọụka bụ Board of Trustees nke ụlọụka ahụ site n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na 17 Nọvemba 2026.
Ụkọchukwu Odukoya kwuru na mkpebi ndị ha nwere n'ọgbakọ ahụ na mwepụ e wepụrụ ya megidere iwu na-achịkwa ụlọụka ahụ, tinyere nke na-achịkwa etu e si ehiwe ọgbakọ ndị ndu ụlọụka nakwa iwepụ Onyeisi Ụkọchukwu.
Kedụ ikike dịịrị Ụkọchukwu Odukoya

Ebe foto si, Fountain of Life Church/Facebook
Ụkọchukwu Odukoya kwuru na akwụkwọ iwu na-achịkwa ụlọụka Fountain of Life Church dịka emezigharịrị n'ụbọchị 16 Jenụwarị 2003 kwuru na Onyeisi nchụaja nwere ikike ndị so ọkwa ya nke gụnyere ịbụkwa Onyeisioche ndị ndu ụlọụka (Chairman Board of Trustees).
Ọ sị na iwu ahụ gakwara n'ihu kọwaa usoro e nwereike iji wepụ Onyeisi nchụaja nke mere ọkwa ahụ jiri dị iche n'ọkwa ndị ọzọ ma sị na e nweghi ike iwepụ onye ahụ n'ọkwa site naanị n'ọgbakọ ụfọdụ ndị ndu ụlọụka nwere nke na-esoghi n'ụzọ iwu kwadoro.
O kwuru na nsogbu a abụghị maka onye ji ọkwa ole n'ụlọụka kama na ọ bụ maka ichekwa iwu na-achịkwa ụlọụka ha.
Ihe Ụkọchukwu Odukoya na-arịọ ụlọikpe
Ụkọchukwu Odukoya sị na ọ chọrọ ka ụlọikpe leba anya n'akwụkwọ iwu na-achịkwa ụlọụka Fountain of Life Church iji kwupụta ma ndị a ọ dara iwu site n'ọgbakọ ndị ahụ ha nwere nke e jiri wepụ ya n'ọkwa dịka Onyeisi nchụaja.
O kwuru na ndị ndu ụlọụka adịla mbụ gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe nke sịrị ka ọ kwụsịtụ ọrụ dịka Onyeisi nchụaja ruo mgbe ụlọikpe ga-eleba okwu ahụ anya kama na ọ pụtaghị na Ụlọikpe Ukwu ekpebiela ma nye iwu.
Ụkọchukwu Odukoya sị na ihe mere o jiri gaa n'ụlọikpe abụghị ka o buso ndị ndu ụlọụka ha agha kama na ọ bụ iji zaghachị n'esemokwu dị n'etiti ndịisi ụlọụka bụ nke ha dị na mbụ kpụpụ ya n'ụlọikpe.
O kwuru na ebe uche ya nọ n'oge niile a bụ ilekọta nakwa ịzụ igwe mmadụ bụ ụlọụka ha e tinyere ya n'aka nakwa ịkwalite ọrụ Chineke.
Kama na ebe ọ bụ na ha akpụpụla ya n'ụlọikpe, na ọ dị mkpa ka ọ gbaa akwụkwọ nke n'ụlọuikpe iji leba anya ma kọwaa ọfụma usoro iwu na-achịkwa ụlọụka Fountain of Life Church.
Ọ gara n'ihu kwuo na ebe ụlọụka na-elekwasị anya ugbua bụ ụzọ dị mma a ga-esi gboo nsogbu esemokwu a maọbụ site n'ụlọikpe maọbụ site na mkparịtaụka udo.
Cheta na Ụlọikpe Ukwu dị na Lagos nọọrọ n'ụbọchị 18 Nọvemba 2026 mgbochie Ụkọchukwu Jimmy Odukoya ka ọ ghara igosi onwe ya dịka onyeisi ụlọụka ahụ site n'akwụkwọ ndị ndu Incorporated Trustees gbara ya.
Ọkaikpe O.O. Adewunmi-Oshin nyere Ụkọchukwu Odukoya mgbochi a site n'arịrịọ ndị ndu ụlọụka ahụ rịọrọ ụlọikpe.
Ka ọ dị ugba, onweghi onye maara ihe nwereike ime n'ụlọụka ahụ mgbe ndị na-efe ofufe ga-aga n'ụlọụka n'ụbọchị Sọnde 22 Nọvemba 2026 maọbụ gawa n'ihu.
Ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ "kedụ onye ga-edu ofufe maọbụ nọrọ n'isi ebe nchụaja n'oge a"?


























