A tọrọla mmadụ 19 gunyere ndị NYSC n'Imo state

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na a tọrọla mmadụ ruru 19, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ji otu afọ efe ala nna Nigeria a kpọrọ 'NYSC n'ịchafụ.
A tọọrọ ha n'Ọgbakụ dị n'Imo steeti dịka Nigeria na-emerube emume ncheta afọ 66 ha nwetara nnwereonwe n'aka mba Briten.
Ọdachi a mere n'ụtụtụ Tọzde oge ndị ojiegbe wakporo ụgbọala abụọ nke ụlọọrụ njem 'Uko Akwa-Ibom Transport Limited' nke si Ibadan buru ndị njem gụnyere ndị ji otu afọ efe ala nna ha aga Ọwụwa anyanwụ ụbọchị Wenezde.
Ndị ntọ tọrọ ọtụtụ n'ime ha kpụrụ ha tibaa n'ime ọhịa.
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ndị e jiri osisi tuchie okporoụzọ, ụgbọala bọọsụ kwụsịrị akwụsị nakwa ndị mmadụ na igwe mmadụ gbakọrọ.
Onye nwe ụlọọrụ njem ahụ bụ Isaiaah Akpan gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ dachi ahụ bụ eziokwu.

Ebe foto si, Screengrab/Police
Akpan kwuru sị,"Ụgbọala m abụọ butere ndị mmadụ n'Ibadan n'abalị gara aga. Otu n'ime ha na-aga n'ogige ndị NYSC n' Akwa-Ibom nke abụọ na-aga na NYSC camp n'Imo steeti.
"Ha abụọ ruru Onitsha n'abali n'ihe dịka elekere itoolu mana n'ụtụtụ taa ka ha bidoro njem ha atọrọ ha n'ebe Ogbaku n'Imo steeti"..
"Ụgbọala abụọ ahụ nwere ndị njem iri na ise. Ndị tọọrọ ha kpọọrọ ndị njem niile nọ n'otu ụgbọala ahụ, ma kpọọrọ mmadụ anọ n'ụgbọala nke abụọ." "Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị a tọọrọ bụrụ mmadụ iri na itoolu."

Ebe foto si, Screengrab
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị 'corper' na-eme njem ma kwuo na "ugbua anyị nọ n'isi ihe na-eme".
"Ndị uweojii na-agba mbọ ugbua ịzọpụta ndị a tọọrọ, ma jide ndị kpara mkpamkpa ahụ.































