Carter Efe na Speed Darlington: A kụọla Akpị den dere dem

Speed Darlington ji ka kpuchie isi ya, ebe Carter Efe pịrị aka ọkpọ, ebe okpuasọmpi guzo n'etiti ha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Carter Efe ji ọkpọ dozie otiegwu a ma ama bụ Darlington Okoye a ma dịka 'Speed Darlington' maọbụ 'Akpị' ihu n'asọmpị ọkpọ ha kụrụ na Lagos n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2026.

Efe meriri Akpị na-enweghị mgbagha ọbụla n'asọmpi ahụ ha sọrọ agba anọ n'oge niile ha kụrụ ọkpọ ahụ.

Akpị bụ onye gara ọgụ ahu ibute ike, dịka ego nrite asọmpi ahụ bụ nde naịra iri ise (N50m), bere ebe ma jiri aka ya abụọ chee n'isi ka ọkụkọ mmiri na-ama, ebe Carter kụrụ ya den dere dem, na-esepụghị aka.

Speed Darlington
Nkọwa foto, Speed Darlington ji nganga na egwu bata ọgbọ, ibute ike mana o bu mkparị, ahụ ụfụ laa

Nke a abụghị mbụ, Carter na-egosi Akpị, gbara afọ 42 na e nwere odogwu, nwee ọdịegwu.

Carter Efe meriburu otiegwu Habeeb Okikiola Badmus a ma ama dịka Portable n'asọmpi ọkpọ ha kụrụ n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, 2026.