Etu ala ọmajiji si taa isi mmadụ 32, merụọ mmadụ 700 ahụ na Venezuela

Ebe foto si, Getty Images
Ihe karịrị mmadụ 32 anwụọla, ebe ọpekatampe mmadụ 700 merụrụ ahụ, mgbe oke alaọmajijiji abụọ kụrụ Venezuela n'akụkụ isi obodo ya, Caracas.
Dịka ndị ọrụ ụlọọrụ nnyocha alaọmajijiji nke Amerịka bụ 'US Geological Survey (USGS)' si kwuo, alaọmajijiji mbụ a mere, rụrụ ogogo 7.2, ebe nke abụọ na-erughị otu nkeji rụrụ ogogo 7.5.
Onye nọ dịka onyeisi ọchịchị mba Venezuela bụ Delcy Rodríguez, ekwupụtala ọnọdụ mberede na mba ahụ, ma ziga ndị ọrụ gbatagbata ka ha na-achọ ndị ka nọ n'okpuru ụlọ ndi dara ada.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ụlọ dara ada, ebe ụfọdụ mebiri nke ukwuu na Caracas na mpaghara ndị ọzọ. Ọdụụgbọelu mba ụwa nke Maiquetía mechiri emechi n'ihi mmebi ọ nwetara.
Ndịọrụ nnyocha kwuru na enwereike ịhụ ozu ndi mmadu na mmebi ndị ọzọ ka ọrụ nzọpụta na-aga n'ihu.

Ebe foto si, Getty Images
Alaọmajijiji ahụ metụtakwara ụfọdụ mpaghara mba Kolombịa, ebe ọtụtụ ndị bi na ya kwuru na ha nụrụ mkpọtụ na ịmajijiji ahụ.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, kwuru na Amerịka dị njikere inyere Venezuela aka n'ọrụ nzọpụta na mgbake.




























