Ọ na-atọ m ụtọ ma ndị mmadụ kpọọ m onye Igbo - Genoveva Umeh

Aha onyonyo, Ịbụ onye Igbo bụ njirimara m ji eme nganga - Genoveva Umeh
Ọ na-atọ m ụtọ ma ndị mmadụ kpọọ m onye Igbo - Genoveva Umeh
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Chinonso Orji Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Onye na-eme ejije a ma ama bụ Genoveva Umeh ekwuola na ịsụ asụsụ Igbo na-atọ ya nnukwu ụtọ maka na ọ na-echetara ya mgbọrọgwụ ya nakwa njirimara ya.

Genoveva Umeh kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka.

O kwuru na ọ bụ nne na nna ya kụziiri ya ka e si asụ asụsụ Igbo, dịka o kwukwara na ga-akụziri ụmụ ya asụsụ Igbo ka ha na ndị ọzọ nweeike na-enwe mkparịtaụka nke ọma.

"Nne na nna m na-asụ Igbo nke ọma. Ha na-etinyekwa ilu ma ha na-ekwu okwu. Ụbọchị niile, otu ilu ga-apụtarịrị ha n'ọnụ. Obere ihe ha asị "ngwere amaghị ihe...... narị ikuku".

"Ilu ha na-atụ ka nkụ ma ha na-asụkwa ya nke ọma. Oge m nọ Enugwu, anyị na-asụ Igbo dịka ezinaụlọ, oge anyị gakwara Lọndọn, anyị na-asụ Igbo n'ụlọ. A na-asụkwara m Igbo ma anyị pụọ, ọ bụrụ na ha achọghị ka onye ọzọ nụ ihe anyị na-ekwu. Ọ dịịrị m ezigbo mfe ịsụ ya, ma ọ na-emekwa ka m mata njirimara m nke ọma."

"Ọ bụrụ na m mụta ụmụ, aga m agba ezigbo mbọ ime ka ha mụta asụsụ Igbo, ka ha na mama nnukwu ha na ụmụnne ha ndị ọzọ nweeike na-enwe mkparịtaụka. Ọ na-atọ ụtọ n'obi ma ọ bụrụ na mmadụ ghọta gị oge ị na-ekwu okwu. Igbo m adịchaghị mma mana aga m agba mbọ hụ na ha gara ụlọakwụkwọ ha ga-anọ mụta ya," ka Genoveva Umeh gwara anyị.

Genoveva Umeh kwuru na ya bụ onye Anambara Steeti mana a mụrụ ya n'Enugwu, ọ gaa ụlọakwụkwọ praịmarị na St Cyprain's Primary School nakwa Command Day Primary School. Ọ gụkwara klaasị mbụ nke sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Command Day Secondary School dị n'Enugwu tupu nne na nna ya akpọrọ ya gaa Lọndọn.

Ọ sịrị na ya gụrụ maka iwu na mahadum tupu ọ lọghachi Lagọs ma banye ebe a na-azụ ndị chọrọ ime ejije.

"Mgbe m malitere ime ihe nkiri, nne na nna m sịrị m buru ụzọ gụchaa akwụkwọ maka na ọ bụ ya ga-enyere m aka ịgate aka na ndụ. Ọ bụ ya ka m jiri gaa mahadum, gụọ maka iwu ma were asambodo m nye ha, sịzie ha ka e mesịa. Ka ọ gachara otu izuụka m gụchara akwụkwọ, m lọta Legọs".

"Tupu m mee ejije 'Blood Sisters 1', agara m ọzụzụ n'Ebony Life Creative Academy dị na Legọs. Edebanyere m aha ma banye n'agba nke mbụ," Ka Genoveva Umeh kọọrọ anyị.

O kwuru na ndị kpaliri mmụọ ya ime ejije gụnyere Genevieve Nnaji na Adesua Etomi, ebe ọ ga-amasịkwa ya ka ya na Genevieve Nnaji na Patience Ozokwor mekọọ ejije Igbo.