Ikpe a mebiri aha m kpamkpam - Dieziani Madueke

Onye bụbu Minista na-ahu maka mmanụ agbịdị na Naijiria bụ Dieziani Alison Madueke ekwuola na ọ bụ ndị obi adịghị mma n'agha ọ na-ebu megide nrụrụaka na ngalaba mmanụ agbịdị bụ ndị mụnyere ọkụ butere nsogbu ya na mba Briten.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe mba Briten sị ya lawa na ikpe amaghị ya n'ebubo iri ngarị oge ọ bụ minista.
Madueke bụụrụ Minista mmanụ agbịdị n'agbata afọ 2010 na 2015 n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan ma bụrụ nwaanyị mbụ na-abụ onyeisi otu mba ndị na-emepụta mmanụ agbịdị a kpọrọ 'Opec' n'ịchafụ.
Na mkparịtaụta ya na BBC nwere, Dieziani kwuru na nsogbu ahụ nyere ya ajọ aha.
"O mebiri aha m kpamkpam malite na mbido, n'ihi na abụ m onyeisi otu Opec (Organisation of Petroleum Exporting Countries) ma bụrụkwa n'otu oge ahụ, nwaanyị mbụ na-abụ onyeisi otu mba ndị na-ebupụ gaasị nke isi ụlọọrụ ha dị na Doha, Qatar."

Ebe foto si, Getty Images
Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu ya gụnyere ịbụ nwaanyị mbụ bụụrụ Minista mmanụ agbịdị nakwa onyeisi otu Opec.
Cheta na e kpere Madueke ikpe banyere ebubo nrụrụaka ihe ruru afọ iri tupu a sị na ikpe amaghị ya.
Kirie ya n'uju:



